Cheta Ndị Agadi Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
1 Ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ, n’agbanyeghịkwa na o meela agadi, Ana dị afọ 84 ‘adịghị mgbe ọ na-akọ ụkọ n’ụlọ nsọ.’ Ikwesị ntụkwasị obi ya kpaliri Jehova ime ka o nweta ngọzi pụrụ iche. (Luk 2:36-38) Taa, ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-egosipụta mmụọ yiri nke Ana n’agbanyeghị na ha na-eche ọnọdụ ndị siri ike ihu. Mgbe ndị dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-alụso nsogbu ahụ́ ike ma ọ bụ adịghị ike dị iche iche ndị ime agadi na-akpata ọgụ, ha pụrụ inwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ dị irè anyị pụrụ isi na-agba ha ume ma na-enyere ha aka ịnọgide na-enwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma.
2 Nzukọ na Ozi: Mgbe ndị ọzọ ji ịhụnanya meere ha ndokwa maka ime njem, ọ pụrụ ịdịrị ọtụtụ ndị agadi mfe karị ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya. Nke a na-ewuli ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ elu n’ụzọ ime mmụọ, ma na-abakwara ọgbakọ uru. Ì kerewo òkè n’ịrụ ọrụ ọma a?—Hib. 13:16.
3 Ikerechi òkè anya n’ozi na-ewetara ezi Ndị Kraịst ọṅụ na afọ ojuju. Ma ime otú ahụ pụrụ ịbụ ihe isi ike nye ndị agadi na ndị na-adịkwaghị ike. Ọ̀ ga-ekwe omume otu n’ime ndị a a hụrụ n’anya isonyere gị dị ka “onye ọrụ ibe” gị n’otu akụkụ nke ọrụ ịgba àmà? (Rom 16:3, 9, 21) Ikekwe, ị pụrụ ịkpọ ya ka o soro gị jiri telifon gbaa àmà ma ọ bụ ka o soro gị gaa otu nletaghachi ma ọ bụ ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na onye ahụ meworo agadi agaghị enwe ike isi n’ụlọ ya pụọ, onye a na-amụrụ ihe ọ̀ pụrụ ịbịa n’ụlọ ya maka ọmụmụ ihe?
4 Ọmụmụ Ihe na Mkpakọrịta: Site n’oge ruo n’oge, ụfọdụ na-agwa onye agadi ma ọ bụ onye na-adịkwaghị ike ka ọ bịa sonyere ha n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha, ọbụna nọrọ n’ụlọ ya nwee ọmụmụ ihe ahụ. Otu nne kpọọrọ ụmụ ya abụọ na-eto eto gaa n’ụlọ otu nwanna nwanyị mere agadi ka ha nọrọ n’ebe ahụ nwee ọmụmụ ihe ha n’akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible, ha nile nwetakwara agbamume site ná mkpakọrịta ahụ. Ndị dị otú ahụ na-enwekwa obi ụtọ ịbụ ndị a kpọrọ maka nri ma ọ bụ maka ihe omume ndị ọzọ nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọ bụrụ na ndị na-adịkwaghị ike enweghị nnọọ ike nke ime nleta ruo ogologo oge, ikekwe, ị pụrụ ịkpọtụrụ ha ma ọ bụ ịkwụsịtụ na nke ha ma gụọrọ ha akwụkwọ ná mkpirikpi, soro ha kpee ekpere, ma ọ bụ soro ha kerịta ahụmahụ na-ewuli elu.—Rom 1:11, 12.
5 Jehova ji ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi kpọrọ ihe. (Hib. 6:10, 11) Anyị pụrụ iṅomi ya site n’igosipụta na anyị ji ha kpọrọ ihe na site n’inyere ha aka ịnọgide na-enwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma.