Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/02 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite December 9
  • Izu Na-amalite December 16
  • Izu Na-amalite December 23
  • Izu Na-amalite December 30
  • Izu Na-amalite January 6
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 12/02 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite December 9

Abụ nke 193

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi otú a pụrụ isi nyefee Ụlọ Nche nke December 15.

15 min: “Na-akpọsa Ozi Alaeze Ahụ.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, webata aro ndị a tụrụ banyere ụzọ isi na-agụpụta ihe kpọmkwem site na Bible mgbe a na-ezi ozi ọma.—km-IB 12/01 p. 1, para. 3.

18 min: Na-amị Mkpụrụ n’Ezi Ọrụ Nile. Okwu nke ndị na-ege ntị ga-ekere òkè na ya. Ọ bụ okenye ga-ekwu ya. Tụleghachi akụkọ banyere mmalite na ọganihu nke ọgbakọ unu, tinyere mgbalị e mere bụ́ nke dugara n’iguzobe ọgbakọ ahụ. Tupu oge eruo, mee ndokwa ka ụfọdụ ndị bụ́ ndị nọ n’oge ahụ kọọ ahụmahụ ndị na-agba ume. Tụlee ohere ndị e nwere maka inwekwu mmụba, gbaakwa mmadụ nile ume iji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado ọrụ ọgbakọ.

Abụ nke 119 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 16

Abụ nke 29

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche e mere maka ozi ubi na December 25 na January 1.

15 min: Ndị Nwere Uche Ga-aghọta. (Dan. 12:3, 10) Ihe ngosi. Onye nwere mmasị ajụọ, sị: “Olee otú m pụrụ isi jide n’aka na unu nwere nghọta ziri ezi nke ihe Bible na-akụzi?” Onye nkwusa akọwaa ụzọ isi jiri ụzọ ịchọ ihe n’isiokwu n’isiokwu eme ihe mgbe a na-eme nnyocha na Bible. (w96-IB 5/15 p. 19-20) Site n’iji otu ihe atụ ma ọ bụ abụọ sitere n’ihe ọmụmụ nke 5 nke broshuọ Na-achọ eme ihe, ya egosi otú anyị si ghọta nzube Chineke maka ụwa site n’iji nlezianya nyochaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche. Onye nkwusa akọwaa otú a pụrụ isi jiri otu ụzọ ahụ mee ihe iji ghọta nkụzi Bible ndị ọzọ n’ụzọ ziri ezi ma kweta iduziri ya ọmụmụ Bible.

20 min: “Cheta Ndị Agadi Na-ekwesị Ntụkwasị Obi.”b Webata ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche nke August 1, 1994, peeji nke 29. Kwupụta ndokwa ahụ e mere ka ndị na-adịkwaghị ike na-enye akụkọ maka oge ozi ubi ruru minit 15. Mee ndokwa ka mmadụ ole na ole kọọ ahụmahụ ndị na-egosi otú iso ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta si ewetara ma ndị agadi ma ndị so ha na-akpakọrịta ngọzi.

Abụ nke 154 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 23

Abụ nke 136

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, gosi ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 1 na Teta! nke January 8. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke January 6.

18 min: “Gosipụta Iguzosi Ike n’Ihe Ndị Kraịst Mgbe Ọ Dị Onye Ikwu A Chụpụrụ Achụpụ.”c (Paragraf nke 1-8) Ọ bụ okenye ruru eru nke ọma ga-eme ya, jiri ajụjụ ndị e depụtara na-eme ihe. Mee ka nwanna nwoke ma agụ ihe nke ọma gụpụta paragraf nke ọ bụla.

17 min: “Ị̀ Na-atụnye Ụtụ n’Ime Ka E Nwee Akụkọ Ziri Ezi?”d Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, webata ihe e kwuru n’akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 106-108.

Abụ nke 165 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 30

Abụ nke 152

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka December. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-agbanwe oge ha ji enwe nzukọ n’afọ ọzọ, jiri obiọma gbaa mmadụ nile ume ka ha na-abịa mgbe nile n’oge ọhụrụ ndị ahụ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na January, na-adọrọ uche gaa n’akwụkwọ ndị ọgbakọ nwere.

15 min: “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit.” Okwu. Maa ọkwa ụbọchị unu ga-enwe mgbakọ sekit unu ọzọ. Gbaa mmadụ nile ume ịbịa na ige ntị n’usoro ihe omume ahụ. Gbaa ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim ume iche echiche banyere iru eru maka ịbụ ndị e mere baptizim. Mee mgbalị pụrụ iche ịkpọ ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible ịbịa.

20 min: “Gosipụta Iguzosi Ike n’Ihe Ndị Kraịst Mgbe Ọ Dị Onye Ikwu A Chụpụrụ Achụpụ.”e (Paragraf nke 9-14) Ọ bụ okenye ruru eru nke ọma ga-eme ya, jiri ajụjụ ndị e depụtara na-eme ihe. Mee ka nwanna nwoke ma agụ ihe nke ọma gụpụta paragraf nke ọ bụla.

Abụ nke 125 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 6

Abụ nke 67

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: Enyemaka n’Irubere Iwu Chineke Banyere Ọbara Isi. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu, nke dabeere n’ihe ndepụta nke alaka ụlọ ọrụ ga-enye. Odeakwụkwọ kwesịrị inwe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ihe ndị na-esonụ maka ikesa ha: Kaadị Advance Medical Directive/Release, na Identity Card. A ga-eme ka ndị nkwusa e mere baptizim nweta ihe ndị a mgbe a gbasasịrị nzukọ n’uhuruchi a, ma ha EKWESỊGHỊ idejupụta ha n’uhuruchi a. Ịbịanye aka, ịgba akaebe, na idenye akara ụbọchị na kaadị ndị ahụ ga-abụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ, site n’enyemaka nke onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ, n’ebe ọ dị mkpa. [E kwesịrị inye ndị mụrụ ụmụ Identity Card maka ụmụ ha.] Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị ịhụ n’ezie mgbe onye ahụ na-abịanye aka na kaadị ya. Ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim pụrụ idepụta ntụziaka nke ha na nke ụmụ ha n’onwe ha site n’ilere anya n’okwu ndị dị na kaadị ndị a ma mee ka ha kwekọọ n’ọnọdụ ha na n’ihe ndị ha kwenyere.

17 min: “Ị Ghaghị Ikiri Vidio Bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge.” Ọ bụ okenye ruru eru ga-eme ya. Gaa ozugbo n’iso ndị na-ege ntị tụlee vidio No Blood, na-eji ajụjụ ndị e depụtara n’igbe dị na peeji nke 7 eme ihe. Mgbe e mesịrị, gụọ paragraf ikpeazụ dị n’igbe ahụ.

N’ọnọdụ ya, tụleenụ “Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe.” Okwu okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke October 1, 2001, peeji nke 4-7.

Abụ nke 79 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya