Gịnị Ka Ị Na-ebute Ụzọ?
1 Ọtụtụ nzukọ okpukpe na-emesi ịrụ ọrụ ebere ike, ọrụ ebere ndị dị ka iwu ụlọ akwụkwọ ụwa ma ọ bụ ụlọ ọgwụ. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na ha adịghị echefu “ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe,” na-ebute inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ ụzọ.—Hib. 13:16.
2 Ihe Nlereanya E Nwere na Narị Afọ Mbụ: Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ọma n’oge ọ nọ na-eje ozi n’elu ala, ma ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ bụ ịgbara eziokwu ahụ àmà. (Luk 4:43; Jọn 18:37; Ọrụ 10:38) O nyere ụmụazụ ya iwu ka ha “[gaa] mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, . . . na-ezi ha [ihe].” (Mat. 28:19, 20) O gosikwara na ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ga-arụ ọrụ ahụ ọ malitere n’ụzọ buru ibu karị. (Jọn 14:12) Jizọs butere ọrụ nkwusa ahụ ụzọ n’ihi na ọ na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta ụzọ nke nzọpụta.—Jọn 17:3.
3 Pọl onyeozi lere ọrụ nkwusa ya anya dị ka “mkpa,” ihe a chọrọ bụ́ nke ọ na-apụghị ileghara anya. (1 Kọr. 9:16, 17) Ọ dị njikere ịchụ ihe ọ bụla n’àjà, ịtachi obi n’ule ọ bụla, ma ọ bụ ịta ahụhụ ọ bụla dị mkpa iji nwee ike ijezu ozi ya. (Ọrụ 20:22-24) Pita onyeozi na ndị ibe ya gosipụtara mmụọ dị otú ahụ. Ọbụna n’agbanyeghị ịtụ mkpọrọ na iti ihe, “ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.”—Ọrụ 5:40-42.
4 Olee banyere anyị? Ànyị na-ebute ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ ụzọ? Dị ka Jizọs, ànyị nwere nchegbu n’ezie maka ndị ahụ ‘a gbara akpụkpọ, chụsasịakwa dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha’? (Mat. 9:36) Ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a nakwa amụma Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na oge na-agwụnahụ ajọ usoro ihe a! Ilekwasị anya ná mkpa ọrụ nkwusa a dị ga-akwali anyị ịnọgide na-eme nkwusa n’ịnụ ọkụ n’obi.
5 Tụlee Ọnọdụ Gị: Ebe ọ bụ na ọnọdụ mmadụ na-agbanwe agbanwe ọtụtụ mgbe, ọ dị mma ịdị na-atụle site n’oge ruo n’oge ma ànyị pụrụ ịhazigharị ihe iji na-ekerekwu òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa. Otu nwanna nwanyị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile n’afọ ndị 1950, 1960, na 1970 wee hụ na ọ ga-adị mkpa ka ọ kwụsị n’ihi nsogbu ahụ́ ike. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ahụ́ ike ya kawanyere mma. Ọ tụleghachiri ọnọdụ ya n’oge na-adịbeghị anya ma kpebie na ya pụrụ ịsụ ụzọ ọzọ. Lee obi ụtọ o nwere ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ mgbe ọ dị afọ 90! Olee banyere gị? Oge ị ga-eji laa ezumike nká ma ọ bụ gụsịa akwụkwọ ọ̀ na-akpụdewe nso? Mgbanwe nke ọnọdụ gị ọ̀ pụrụ inye gị ohere ịsụ ụzọ?
6 Mgbe Jizọs hụrụ na Mata “nwere ndọpụ uche n’ihi ọtụtụ ihe ọ na-eme,” o jiri obiọma tụọrọ ya aro na ọ ga-enweta ngọzi buru ibu karị ma ọ bụrụ na o bie ndụ dị mfe. (Luk 10:40-42) Ị̀ pụrụ ime ka ụzọ ndụ gị dị mfe? Ọ̀ dị mkpa n’ezie ka ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ego? Ọ bụrụ na a hazigharịa ihe, ezinụlọ ọ̀ pụrụ iji nanị ihe otu onye na-akpata na-ebi ndụ? Ọtụtụ ndị eritewo uru n’ụzọ ime mmụọ site n’ịhazigharị ihe iji kerekwuo òkè n’ozi.
7 Ka anyị nile gbasoo ihe nlereanya Jizọs na ndịozi setịpụrụ! Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-agọzi mgbalị anyị ji ezi obi na-eme iji kere òkè zuru ezu n’ọrụ ahụ dị oké mkpa nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ.—Luk 9:57-62.