Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/04 p. 3
  • ‘Ka Anyị Bulie Aha Ya Elu n’Otu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ka Anyị Bulie Aha Ya Elu n’Otu’
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Keleenụ Jehova n’Etiti Mkpọkọta Bara Ụba
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ịgbakọta Ọnụ Iji Nye Jehova Otuto
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ì Jikerela Maka Oriri Ime Mmụọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Na-echere Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 9/04 p. 3

‘Ka Anyị Bulie Aha Ya Elu n’Otu’

1. Olee ohere anyị ga-enwe iji bulie aha Chineke elu n’otu, oleekwa ihe anyị pụrụ ime ugbu a iji kwadebe maka ya?

1 “Sonụ m mee ka Jehova dị ukwuu, ka anyị buliekwa aha Ya elu n’otu,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Ọma 34:3) Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije,” nke na-abịanụ, ga-enye anyị ohere isoro ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị si n’ọtụtụ ọgbakọ bulie aha Jehova elu n’otu. Ì mewo ndokwa nke gị maka ebe obibi na ụgbọ njem, ma nata ikike maka ịha ọrụ? Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị ime ihe ndị a ogologo oge tupu anyị agawa mgbakọ.—Ilu 21:5.

2. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ime atụmatụ irute n’ụlọ mgbakọ n’oge?

2 Irute n’Ụlọ Mgbakọ: E nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme ma anyị gaa mgbakọ. Ịmalite n’oge ga-enyere anyị aka ime ihe banyere ihe ndọghachi azụ ndị a na-atụghị anya ha, ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike ịnọdụ ala n’oge iji jiri obi anyị dum sonye n’ịbụ abụ mmeghe nakwa n’ekpere. (Ọma 69:30) Minit ole na ole tupu usoro ihe omume amalite, onyeisi oche ga-anọdụ ala n’ikpo okwu ka a na-akpọ abụ olu ụtọ Alaeze nke ga-eduga ná mmalite nnọkọ. Anyị nile kwesịrị ịnọdụ ala oge ahụ ka ihe omume ahụ wee nwee ike ịmalite n’ụzọ dị ùgwù.—1 Kọr. 14:33, 40.

3. Olee ndị a pụrụ ịchọtara oche ná mgbakọ?

3 Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ ikwe ‘ka ihe nile anyị na-eme na-ewere ọnọdụ n’ịhụnanya.’ (1 Kọr. 16:14) Ị pụrụ ịchọta oche nanị maka ndị gị na ha so mee njem n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ.—1 Kọr. 13:5; Fil. 2:4.

4. Olee ndokwa ndị e meworo maka nkwụsịtụ nke ehihie, oleekwa otú nke a si baa uru?

4 Ị pụrụ iri nri ehihie gị n’ime ụlọ mgbakọ. Biko emetọsịla ebe ahụ, ma ọ bụ hapụ ihe ndị e ji kechie ihe n’ala. Iri nri n’ime ụlọ mgbakọ ga-eme ka mmadụ nile nwee mkpakọrịta na-ewuli elu ma nọrọ ya ná mmalite nke nnọkọ ehihie. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, a pụrụ iji obere igbe nri nke pụrụ ịba n’okpuru oche mee ihe. A chọghị ka e webata igbe nri ndị buru ibu, tinyere karama na arịa ndị na-akụwa akụwa, n’ụlọ mgbakọ. Ọzọkwa, a chọghị ka e webata ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya n’ala mgbakọ ahụ. N’oge gara aga, a hụwo ka ụfọdụ na-esi nri n’ebe e nyere ha ụlọ ka ihe omume na-aga n’ihu. Nke a adịghị egosi ekele maka ihe ime mmụọ.—Luk 10:38-42.

5. Olee otú anyị pụrụ isi dozie obi anyị maka ntụziaka anyị ga-enweta?

5 Oriri Ime Mmụọ Na-echere Anyị: Eze Jehoshafat bụ onye ‘doziri obi ya ịchọ Chineke.’ (2 Ihe 19:3) Olee otú anyị pụrụ isi dozie obi anyị tupu mgbakọ amalite? Isiokwu ndị dị na peeji ikpeazụ ná mbipụta Teta! nke September 8 na-atụle n’ụzọ dị mkpirikpi oriri ime mmụọ e dokwara. Gịnị ma i wepụta oge iji tụgharịa uche n’isiokwu ndị ahụ, na-atụ anya ihe Jehova kwadebeere anyị? Idozi obi anyị na-agụnyekwa ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịghọta ntụziaka anyị ga-enweta ma tinye ya n’ọrụ.—Ọma 25:4, 5.

6. Gịnị bụ ọchịchọ anyị, n’ihi gịnịkwa?

6 Ọ na-agụsi anyị nile agụụ ike ịmụtakwu ihe n’Okwu Chineke, na-aghọta na site na ya, anyị pụrụ itoru nzọpụta. (1 Pita 2:2) N’ihi ya, ka anyị nọrọ ya ná Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije” ma ‘bulie aha Jehova elu n’otu.’—Ọma 34:3.

Igbe dị na peeji nke 3]

Ụzọ Isi Bulie Aha Chineke Elu

◼ Ime ndokwa tupu mgbakọ eruo

◼ Gosi ndị ọzọ ịhụnanya

◼ Dozie obi gị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya