Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
N’ụbọchị ndị a, e nwere ọtụtụ ihe ọmụma banyere ime ka ọnọdụ obi nkịtị anyị dị mma ka anyị wee dịkwuo ogologo ndụ nke na-enye obi ụtọ karị. Nke dị mkpa ọbụna karị bụ ọnọdụ nke obi ihe atụ anyị. Mgbe ahụ, lee ka isiokwu nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche bụ́ “Iji Obi Zuru Okè Na-ejere Jehova Ozi” si kwesị ekwesị, bụ́ nke ga-amalite na February 2004. (1 Ihe 28:9) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịtụ anya ịmụta?
Onye nlekọta sekit ga-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Inyere Ndị Ọzọ Aka Iji Mkpụrụ Obi Jupụtara n’Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi.” Ajụjụ ọnụ a ga-agba ndị mmadụ ga-eme ka ọṅụ a na-enweta n’ịzụlite mmasị nakwa n’iduziri ndị chọrọ ijere Jehova ozi ọmụmụ Bible pụta ìhè. Obi abụọ adịghị ya na ndị nile bịaranụ ga-enweta nkasi obi na agbamume site n’okwu mbụ nke ọkà okwu si esi bịa bụ́ “Iche Obi Anyị Nche n’Ime Ụwa nke Nọ ná Nsogbu.” A ga-eji okwu baptizim mechie nnọkọ nke ụtụtụ.
N’ehihie, isiokwu bụ́ “Inye Aka” ga-atụle otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka. Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji chebe obi ụmụ ha pụọ ná mmetụta ọjọọ ma nyere ha aka ịbịaru Jehova nso? Isiokwu bụ́ “Nyere Ụmụ Gị Aka Inweta Ọṅụ n’Ebe Jehova Nọ” ga-atụ aro ndị dị irè ma gosi otú a pụrụ isi mee nke a.
Ànyị na-eji ndokwa nile Jehova na-eme eme ihe iji mee ka ọnọdụ obi ihe atụ anyị dị mma ma sie ike? Okwu ikpeazụ nke ọkà okwu si esi bịa bụ́ “Nọgide Na-enwe Obi Zuru Okè n’Ijere Jehova Ozi,” ga-elekwasị anya n’akụkụ anọ bụ́ isi na-eme ka anyị nọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Oge na mgbalị há aṅaa ka anyị na-etinye n’ikpesi ekpere ike, n’ịmụ Okwu Chineke, n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa, nakwa n’isoro Ndị Kraịst ndị ọzọ na-akpakọrịta? Ànyị pụrụ imeziwanye ihe na nke ọ bụla n’ime akụkụ ndị a?
Jehova na-akpọ gị òkù, sị: “Mee ka obi gị baa n’ịdọ aka ná ntị, meekwa ka ntị gị abụọ baa n’okwu ọnụ nile nke ihe ọmụma.” (Ilu 23:12) Mee ndokwa ugbu a ịga mgbakọ a nke a ga-enye ntụziaka dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na ya. Ime nke ahụ ga-ewusi gị ike ịnọgide na-eji obi zuru okè na mkpụrụ obi jupụtara n’ọṅụ na-ejere Jehova ozi.