Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
E kere anya n’ụzọ dị ịtụnanya. (Ọma 139:14) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-elegide nanị otu ihe n’otu mgbe. Nke ahụ bụ eziokwu ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ihe atụ. Ka anya ime mmụọ anyị wee na-ahụ ihe nke ọma, anyị aghaghị itinye uche anyị n’ime uche Chineke. N’ihi ihe ndọpụ uche a nọgideworo na-enwe n’ụwa Setan, lee ka o si daba adaba na isiokwu nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche maka afọ 2006 ga-abụ, “Legide Anya Otu Ebe”!—Mat. 6:22.
Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nweta ngọzi n’aka Jehova? (Ilu 10:22) A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu bụ́ “Nweta Ngọzi Ndị Na-esi n’Ilegide Anya Otu Ebe Pụta.” Ajụjụ ọnụ ndị a ga-agba ga-eme ka otú anyị pụrụ isi rite uru site n’itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ pụta ìhè. Okwu mbụ ọkà okwu si esi bịa ga-ekwu, nke isiokwu ya bụ, “Ilegide Anya Otu Ebe n’Ụwa Ajọ Omume,” ga-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe ndị pụrụ ime ka anyị biwe ndụ gbalụ gbalụ ma jiri nke nta nke nta kwụsị iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Anyị ga-amụtakwa ihe ịhọrọ “òkè dị mma” gụnyere.—Luk 10:42.
Olee otú ndị mụrụ ụmụ na ndị ọzọ pụrụ isi gbaa Ndị Kraịst na-eto eto ume ịchụso ihe ime mmụọ? N’isiokwu ndị bụ́ “Ndị Mụrụ Ụmụ Bụ́ Ndị Na-atụzi Àkụ́ Ha Atụzi” na “Ndị Ntorobịa Ndị Na-achụso Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ,” a ga-anụ olu ndị mụrụ ụmụ na nke ndị ntorobịa ka ha na-aza ajụjụ a dị mkpa. (Ọma 127:4) Okwu mmechi nke ọkà okwu si esi bịa ga-ekwu ga-atụle otú anyị nile n’otu n’otu, dị ka ezinụlọ, nakwa dị ka ọgbakọ pụrụ isi soro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.
Ma ànyị ka natara eziokwu ahụ anata ma ànyị anọwo na-ejere Jehova ozi ruo ọtụtụ iri afọ, ọ dị mkpa ka anyị ‘na-elegide anya otu ebe.’ Usoro ihe omume nke mgbakọ a pụrụ iche ga-enyere anyị aka ime nnọọ otú ahụ.