Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Nov. 15
“N’oge ndị gara aga, ọtụtụ ndị kweere na otu ụbọchị, ụwa ga-abụ paradaịs. Taa, ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ma ọ̀ ga-adịgide. Gịnị bụ echiche gị banyere otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe Bible na-ekwu banyere nke a. [Gụọ Abụ Ọma 37:11.] Magazin a na-atụlekwa ihe Bible buru n’amụma maka ụwa.”
Ụlọ Nche Dec. 1
“Okwukwe nke ụfọdụ ndị taa nwere n’ebe Chineke nọ na-ebelata. Otu ihe kpatara nke a bụ na ha enweghị ike ịchọta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị na-enye ha nsogbu n’obi dị ka ndị a. [Nye ihe atụ site n’igbe dị na peeji nke 6.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-atụle otu isi ihe na-eme ka mmadụ nwee ezigbo okwukwe n’ebe Chineke nọ.” Gụọ Ndị Filipaị 1:9.
Teta! Dec. 8
“Ì chere na ọ dị mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ga-anụ ụtọ ọnọdụ ndị dị ka ndị a kọwara n’ebe a? [Gụọ Aịsaịa 14:7. Mgbe ahụ nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a nwere ihe ọmụma dị irè bụ́ ndị ga-abara anyị uru ka anyị na-echere mmezu nke nkwa Chineke.” Kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?”