Biko Gaa Leta Ha Ozugbo
Gaa leta ole ndị ozugbo? Ọ bụ ndị rịọrọ ka e nye ha akwụkwọ anyị ma ọ bụ ka a na-enye ha magazin mgbe nile ma ọ bụ ndị chọrọ ka Onyeàmà kpọtụrụ ha n’ụlọ ha. Olee ebe arịrịọ ndị a na-esi abịa? Ọ bụ site n’aka ndị na-edetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi ma ọ bụ na-akpọtụrụ ha na telifon ma ọ bụ n’ebe anyị na-edebe ihe ọmụma n’Intanet. Mgbe e gosiri mmasị dị otú ahụ, alaka ụlọ ọrụ na-eme ka ọgbakọ mara site n’izigara ha fọm S-70, bụ́ mpempe akwụkwọ nwere isiokwu bụ́, “Please Arrange for a Qualified Publisher to Call on This Person” (“Biko Mee Ndokwa Ka Onye Nkwusa Ruru Eru Kpọtụrụ Onye A”). Mgbe ndị okenye nwetara fọm S-70, ha kwesịrị inye ya otu onye nkwusa ozugbo bụ́ onye ga-esochi nnọọ mmasị ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri onye nkwusa ahụ ike ịchọta onye ahụ n’ụlọ, onye nkwusa ahụ pụrụ ịgbalị ịkpọtụrụ ya na telifon ma ọ bụ jiri nlezianya kpafanyere ya mpempe akwụkwọ e dere ihe na ya n’ọnụ ụzọ. Ọ bụrụ na a gwa gị ka ị gaa mee nleta dị otú ahụ, biko gbalịsie ike ịhụ na i letara onye ahụ nwere mmasị ozugbo.