Igbe Ajụjụ
◼ N’azụ akwụkwọ anyị ụfọdụ, a na-enwe ebe mmadụ nwere ike ịdọkapụta adọkapụta, jiri ya kwuo ka e zitere ya akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke ya mụwara ya Baịbụl. A na-enwekwa ebe a na-edejupụta ụdị ihe ahụ n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org. Ònye kwesịrị idejupụta ha?
Ọtụtụ ndị edejupụtala ma nke na-adị n’akwụkwọ anyị ma nke na-adị n’adres Ịntanet anyị ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ anyị. E sikwala otú ahụ nyere ọtụtụ ndị aka ịbata n’ọgbakọ. Ma, e nweela ụmụnna ndị ji aka ha dejupụta ebe ndị ahụ, kwuo ka e zigara ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị enyi ha akwụkwọ anyị nakwa ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl. Ihe a ha mere akpatala nsogbu ọtụtụ mgbe.
E nweela ndị alaka ụlọ ọrụ zigaara akwụkwọ ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị enyi ha kwuru ka e zigara ha, ha ewee iwe, na-asị na Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko nakwa na ha na-anọkata na-ezigara ndị mmadụ akwụkwọ ha na-ekwughị ka e zitere ha. Mgbe ndị nkwusa ụfọdụ gara na nke ndị ahụ na-ejighị aka ha rịọ ka a bịa duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, ndị ahụ mechuru ha ihu. N’ihi ya, ọ bụ ndị chọrọ ka e zitere ha akwụkwọ anyị ma ọ bụ ka Ndịàmà Jehova bịa mụwara ha Baịbụl ga-eji aka ha dejupụta ebe ahụ a na-adọkapụta adọkapụta n’akwụkwọ anyị. Ọ bụkwa ha ga-eji aka ha dejupụta nke ahụ na-adị n’adres Ịntanet anyị. Ọ bụrụ na ọ bụghị ndị ahụ ji aka ha dejupụta nke ọ bụla e ziteere alaka ụlọ ọrụ, alaka ụlọ ọrụ agaghị eme ihe ọ bụla gbasara ya.
Oleezi otú anyị nwere ike isi nyere onye ikwu anyị ma ọ bụ enyi anyị aka ka ọ mata ihe Baịbụl na-akụzi? Ọ bụrụ na ị chọrọ ka o nweta akwụkwọ anyị, í cheghị na ọ ga-aka mma ka i jiri aka gị zigara ya akwụkwọ ahụ? Ọ bụrụkwa na o kwuru na ya chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa mụwara ya Baịbụl ma ya abụrụ na o nweghị okenye nọ n’ọgbakọ dị ebe o bi ị ma, dejupụta fọm Please Follow Up (ya bụ, S-43) ma nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu. Ọ ga-ezigara ya alaka ụlọ ọrụ. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ nọ mkpọrọ ma ọ bụ ụlọ ọgwụ, ejikwala aka gị edetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ gbasara ya. Ihe ị ga-eme bụ, gwa ya ka ọ gwa ụmụnna ndị na-abịa ezi ozi ọma ebe ahụ ka ha mụwara ya Baịbụl ma ọ bụkwanụ ka o jiri aka ya detara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ.