Jehova Na-enyere Ndị Na-atụkwasị Ya Obi Aka
1 Ọtụtụ mmadụ na-ele ego, ike, na nkà ụmụ mmadụ anya dị ka isi ihe ndị na-eweta ihe ịga nke ọma. (Ọma 12:4; 33:16, 17; 49:6) Otú ọ dị, ndị na-atụ egwu Jehova ma na-atụkwasị ya obi na-abụ ndị okwu Bible bụ́ na “inyeaka ha na ọta ha ka Ọ bụ,” na-emesighachi obi ike. (Ọma 115:11) Ka anyị tụlee ebe abụọ ọ dị anyị mkpa igosipụta na anyị na-atụkwasị Jehova obi.
2 Dị Ka Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ozi: Mgbe ọ bụla anyị na-eme ihe omume n’ọgbakọ ma ọ bụ na-ezi ihe n’ozi ubi, anyị aghaghị ịdabere n’ebe Chineke anyị nọ. Tụlee ihe nlereanya Jizọs. Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara Chineke, ọ tụkwasịghị obi n’amamihe ma ọ bụ n’ikike nke onwe ya, kama ọ dabeere kpam kpam n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. (Jọn 12:49; 14:10) Lee ka o si dị anyị mkpa karị ime otu ihe ahụ! (Ilu 3:5–7) Ọ bụ nanị mgbe Jehova gọziri obere mgbalị ndị anyị na-eme ka ọ ga-enye ya nsọpụrụ ma baara ndị ọzọ uru.—Ọma 127:1, 2.
3 Anyị na-egosipụta na anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ site n’ikpe ekpere maka nduzi ya na enyemaka nke mmụọ nsọ ya. (Ọma 105:4; Luk 11:13) Tụkwasị na nke ahụ, anyị na-egosi na anyị na-atụkwasị Chineke obi site n’ime ka ozizi anyị na-adabere n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ozi ya nwere ike nke iru n’obi na ịgbanwe ndụ. (Hib. 4:12) Mgbe anyị ‘na-eje ozi dị ka ndị na-adabere n’ike nke Chineke na-enye,’ Jehova na-abụ onye e nyere otuto.—1 Pita 4:11.
4 Iche Nsogbu Ihu: Ọ dịkwa anyị mkpa ilegara Jehova anya maka enyemaka mgbe anyị na-eche nrụgide na nsogbu ihu. (Ọma 46:1) Dị ka ihe atụ, onye were anyị n’ọrụ pụrụ ịjụ inye anyị oge ịhapụ ọrụ iji gaa mgbakọ, ma ọ bụ anyị pụrụ iche ọnọdụ ndị tara akpụ ihu ná ndụ ezinụlọ anyị. Anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi site n’ikpekusi ya ekpere ike ma na-etinye nduzi ndị ọ na-enye site n’Okwu ya na nzukọ ya n’ọrụ. (Ọma 62:8; 119:143, 173) Site n’ime otú ahụ, ndị ohu Jehova na-ahụ enyemaka ya ná ndụ ha.—Ọma 37:5; 118:13, 16.
5 Jehova n’onwe ya na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị Jehova obi, onye Jehova bụ ihe ntụkwasị obi ya.” (Jer. 17:7) Ka anyị na-egosipụta na anyị na-atụkwasị ya obi n’ihe nile anyị na-eme!—Ọma 146:5.