Ntachi Obi Nwere Ụgwọ Ọrụ
1 “Site ná ntachi obi unu, unu ga-enweta mkpụrụ obi unu.” (Luk 21:19) Okwu ndị ahụ, bụ́ ndị so n’amụma Jizọs buru banyere “ngwụsị nke usoro ihe a,” na-eme ka o doo anya na iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, anyị aghaghị ịdị njikere iche ọtụtụ ọnwụnwa ihu. Ma site n’ike Jehova, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ‘ịtachi obi ruo ọgwụgwụ’ ma bụrụ “onye a ga-azọpụta.”—Mat. 24:3, 13; Fil. 4:13.
2 Mkpagbu, nsogbu ahụ́ ike, nsogbu ego, na obi erughị ala pụrụ ime ka ụbọchị ọ bụla taa akpụ. Otú ọ dị, anyị ekwesịtụghị ichefu na Setan na-anwa imebi nguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Jehova. Ụbọchị nke ọ bụla anyị guzosiri ike n’ihe nye Nna anyị, ụbọchị ahụ esonyela n’ụbọchị ndị anyị meworo ka o nwee ihe ọ ga-azaghachi Ọta Ụta ahụ. Lee ihe na-akwụghachi ụgwọ ọ bụ ịmara na a dịghị echefu “anya mmiri” gbara anyị n’oge ule! Ha dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova, iguzosi ike n’ezi ihe anyị na-emekwa ka obi ya ṅụrịa!—Ọma 56:8; Ilu 27:11.
3 Ndị Ọnwụnwa Na-anụcha: Nsogbu pụrụ ime ka adịghị ike nke okwukwe ma ọ bụ àgwà na-adịghị mma, dị ka mpako ma ọ bụ enweghị ndidi, pụta ìhè. Kama ịnwa izere ọnwụnwa ma ọ bụ iji ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị kwụsị ya, anyị aghaghị ịṅa ntị na ndụmọdụ nke Okwu Chineke bụ́ “ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya.” N’ihi gịnị? N’ihi na iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ọnwụnwa na-enyere anyị aka ịbụ ndị ‘zuru ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile.’ (Jems 1:2-4) Ntachi obi pụrụ inyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị dị oké ọnụ ahịa, dị ka ezi uche, mmetụta ọmịiko, na ebere.—Rom 12:15.
4 Ọdịdị Okwukwe nke E Lere Ule: Mgbe anyị na-atachi obi n’ọnwụnwa, anyị na-enweta ọdịdị okwukwe e lere ule bụ́ nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. (1 Pita 1:6, 7) Okwukwe dị otú ahụ na-akwadebe anyị iguzosi ike n’ọnwụnwa ndị anyị ga-enwe n’ọdịnihu. Ọzọkwa, anyị pụrụ inweta nkwado Chineke, nke a ga-emekwa ka olileanya anyị sikwuo ike, na-eme ka ọ bụrụ ihe dị adị n’ezie nye anyị.—Rom 5:3-5.
5 E mere ka ụgwọ ọrụ kasịnụ nke ntachi obi pụta ìhè na Jems 1:12, bụ́ nke na-asị: “Obi ụtọ na-adịrị onye nọgidere na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na n’ịbụ onye a nwapụtara, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ.” N’ihi ya, ka anyị nọgide na-eguzosi ike n’ofufe anyị na-efe Jehova, na-enwe obi ike na ọ ga-akwụghachi “ndị nọgidere na-ahụ ya n’anya” ụgwọ n’ụba.