Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/04 p. 1
  • Nọgide Na-enwe Echiche nke Ịdị Ngwa!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-enwe Echiche nke Ịdị Ngwa!
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Chebe Echiche nke Ịdị Ngwa Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Otú Anyị Ga-esi Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ịgbasikwu Àmà ahụ Ike Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 11/04 p. 1

Nọgide Na-enwe Echiche nke Ịdị Ngwa!

1 Jizọs maara na oge o nwere n’ụwa iji rụzuo ọrụ Nna ya dị ntakịrị. (Jọn 9:4) N’ihi ya, o ji echiche nke ịdị ngwa jee ozi ya, ọ zụkwara ndị na-eso ụzọ ya ime otú ahụ. (Luk 4:42-44; 8:1; 10:2-4) O debere ihe onwunwe n’ọnọdụ nke abụọ. (Mat. 8:20) N’ihi ya, ọ rụchara ọrụ Jehova nyere ya.—Jọn 17:4.

2 Oge Dị Nta: Oge e nwere iji kwusaa ozi ọma ahụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi” dịkwa ntakịrị. (Mat. 24:14) Amụma Bible na-egosi na anyị abamiela n’oge ọgwụgwụ. N’oge na-adịghị anya, “ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs . . . ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke mbibi ebighị ebi.” (2 Tesa. 1:6-9) Ikpe ọmụma ahụ ga-abịa na mberede n’ụzọ dị ịrịba ama. (Luk 21:34, 35; 1 Tes. 5:2, 3) Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mara banyere ọnọdụ dị ize ndụ ha nọ na ya. Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị anyị inyere ha aka ịchọ ihu ọma Jehova mgbe oge ka dị.—Zef. 2:2, 3.

3 Ime Ihe Nile Anyị Nwere Ike Ime: N’ịghọta na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị,” ndị ohu Chineke na-ebute ọrụ nkwusa ahụ ụzọ. (1 Kọr. 7:29-31; Mat. 6:33) Ụfọdụ ndị ahapụwo ohere ndị ha nwere ịkpata ego ma ọ bụ nchụso onwe onye ndị ọzọ iji mụbaa òkè ha na-ekere n’ozi. (Mak 10:29, 30) Ndị ọzọ anọgidewo na-enwe “ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị” n’agbanyeghị ule ndị ha nọgidere na-enweta. (1 Kọr. 15:58) Ọtụtụ ndị anọwo na-akpọsa ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ iri afọ n’amaghị jijiji. (Hib. 10:23) Jehova na-eji àjà ndị dị otú ahụ a na-achụ iji kwadoo ihe ndị metụtara Alaeze ahụ akpọrọ ihe nke ukwuu.—Hib. 6:10.

4 Ime ka ndụ anyị hiwe isi n’ofufe Jehova, bụ́ nke gụnyere ọrụ nkwusa ahụ, na-enyere anyị aka iburu nnọọ ụbọchị Jehova n’uche. Ọ na-eme ka anyị ghara ịbụ ndị ụwa Setan dọpụrụ uche ha, na-emekwa ka mkpebi anyị mere ịnọgide na-enwe àgwà dị nsọ sikwuo ike. (2 Pita 3:11-14) N’ezie, iji echiche nke ịdị ngwa na-eje ozi anyị pụrụ ịzọpụta ndụ, ma nke anyị ma nke ndị na-ege anyị ntị.—1 Tim. 4:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya