ISIOKWU ỌNWA A: “KWUSAA OKWU CHINEKE, JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA YA.”—2 TIM. 4:2.
Otú Anyị Ga-esi Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
Anyị kwesịrị ịmụta ịna-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. Ọ ga-eme ka a ghara ibibi anyị mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a. Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka.
Na-ekpe ekpere mgbe niile banyere Alaeze Chineke.—Mat. 6:10.
Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ka i wee chebe obi gị.—Hib. 3:12.
Jiri oge gị na-eme ihe ndị bara uru.—Efe. 5:15, 16; Fil. 1:10.
Ekwela ka ọchịchọ nke ụwa a megharịa gị anya.—Mat. 6:22, 25; 2 Tim. 4:10.
Nọrọ ná nche ka i nwee ike ịmata otú amụma ndị e buru na Baịbụl si na-emezu.—Mak 13:35-37.
Anyị ga-enyere ọtụtụ mmadụ aka ma ọ bụrụ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Jọn 4:34, 35.