Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/05 p. 1
  • Ime Nkwusa Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Nkwusa Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ntachi Obi nke Na-eweta Mmeri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 6/05 p. 1

Ime Nkwusa Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

1 Okwu Chineke na-agba anyị ume ‘iji ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e setịpụrụ n’ihu anyị.’ (Hib. 12:1) Dị nnọọ ka o si adị onye na-agba ọsọ mkpa ịtachi obi iji gbata ihe n’ọsọ, n’otu aka ahụ, ọ dị anyị mkpa ịtachi obi iji nweta ihe nrite ahụ nke bụ́ ndụ ebighị ebi. (Hib. 10:36) Olee otú ozi anyị na-eje dị ka Ndị Kraịst pụrụ isi nyere anyị aka iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi ruo ọgwụgwụ?—Mat. 24:13.

2 Ndị E Wusiri Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ: Anyị ịkpọsa nkwa dị ebube Bible na-ekwe banyere ụwa ọhụrụ ezi omume na-enyere anyị aka inwekwu olileanya. (1 Tesa. 5:8) Mgbe anyị na-agachi ozi ubi anya, anyị na-enwe ohere nke ime ka ndị ọzọ mara eziokwu ahụ anyị mụtaworo site na Bible. Anyị na-enwekwa ohere nke ịgbachitere ihe ndị anyị kweere, bụ́ nke na-enyezi aka eme ka anyị gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ.

3 Iji na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible nke ọma, anyị onwe anyị aghaghị ịghọta ya nke ọma. Anyị aghaghị ime nnyocha ma na-atụgharị uche na ya. Mgbalị siri ike anyị na-eme na-eme ka anyị nwekwuo ihe ọmụma, mee ka okwukwe anyị sikwuo ike, ma nye anyị ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 2:3-5) N’ụzọ dị otú a, anyị na-ewusi onwe anyị ike ka anyị na-agbalị inyere ndị ọzọ aka.—1 Tim. 4:15, 16.

4 Ikerechi òkè anya n’ozi ubi so nnọọ ‘n’ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke,’ bụ́ nke dị anyị mkpa iji guzogide Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ. (Efe. 6:10-13, 15) Anyị ịdị na-ejechi ozi ọma anya na-enyere anyị aka ime ka uche anyị dịrị n’ihe ndị na-ewuli elu ma zere ịbụ ndị ụwa Setan merụrụ. (Kọl. 3:2) Ka anyị na-akụziri ndị ọzọ ụzọ Jehova, a na-echetara anyị mgbe nile banyere mkpa ọ dị anyị ịnọgide na-eme omume dị nsọ.—1 Pita 2:12.

5 Ndị Chineke Na-enye Ike: N’ikpeazụ, anyị iso na-arụ ọrụ nkwusa ahụ na-eme ka anyị mụta ịdabere n’ebe Jehova nọ. (2 Kọr. 4:1, 7) Lee ngọzi nke ahụ bụ! Anyị ịmụta inwe ntụkwasị obi dị otú ahụ abụghị nanị na ọ na-ewusi anyị ike ijezu ozi anyị kamakwa, ọ na-ewusi anyị ike ịnagide ọnọdụ ọ bụla anyị pụrụ ịnọ na ya ná ndụ. (Fil. 4:11-13) N’ezie, ịmụta ịdabere kpamkpam n’ebe Jehova nọ bụ isi ihe na-eme ka e nwee ntachi obi. (Ọma 55:22) Ime nkwusa na-enyere anyị aka n’ọtụtụ ụzọ ịtachi obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya