Ntụleghachi Maka Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit
A ga-atụle ajụjụ ndị a ná Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe obere oge tupu ọgbakọ agaa mgbakọ sekit maka afọ 2006 nakwa oge na-adịghị anya ha lọtasịrị. Onyeisi oche ndị nlekọta ga-eme ndokwa maka ntụle a a ga-eme tupu nakwa mgbe a lọtasịrị mgbakọ sekit, dị ka e si kọwaa ya n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2004, peeji nke 4. N’oge a na-eme ntụleghachi ndị a, e kwesịrị ịjụ ajụjụ a nile, na-adọrọ uche gaa n’otú anyị pụrụ isi tinye ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ n’ọrụ.
ỤBỌCHỊ MBỤ
1. Olee otú anyị ga-esi yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka anyị na-aghaghị iji nọgide na-eyi ya?
2. Olee otú ụfọdụ siworo mụbaa òkè ha na-ekere n’ọrụ nkwusa?
3. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ?
4. Olee otú onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ pụrụ isi gosipụta mmadụ ọhụrụ ahụ n’ime ezinụlọ?
5. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị na-akwadosi ọgbakọ ike?
6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-egosipụta ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ n’ozi ubi?
7. Olee otú e si atụgharị uche n’ụzọ kwesịrị ekwesị, oleekwa otú anyị si erite uru ná ntụgharị uche dị otú ahụ?
8. Olee àgwà ndị ga-eme ka anyị bụrụ ndị Jehova ga-enwe ike ịkpụzi?
ỤBỌCHỊ NKE ABỤỌ
9. Olee otú iji ire anyị eme ihe nke ọma dịruru ná mkpa?
10. Olee uru ndị anyị na-erite site n’ikwu okwu ndị dị mma mgbe anyị na ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu?
11. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl nke dị ná Ndị Efesọs 4:25-32 n’ọrụ mgbe anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-emekọrịta ihe?
12. Olee ụzọ kasị kwesị nsọpụrụ anyị kwesịrị isi jiri ire anyị na-eme ihe?
13. Olee ihe anyị na-aghaghị ime iji merie ajọ onye ahụ?
14. Ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị itinyesi mgbalị ike na ha iji bụrụ ndị nọgidere n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị?
15. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji mee ka ụdị mmadụ anyị bụ n’ime na-adị ọhụrụ kwa ụbọchị, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya?
16. Olee ndụmọdụ e nyere n’usoro ihe omume mgbakọ sekit nke afọ a nke ị na-eme atụmatụ itinye n’ọrụ?