Ụlọ Akwụkwọ nke Na-enyere Anyị Aka Itinye Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Ọrụ
1 Ka anyị na-atụle ihe omume ndị e depụtara n’Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2006, anyị ga-agbalịsi ike irite uru n’ozizi ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ site n’itinye ha n’ọrụ n’ozi anyị na-ejere Chineke nakwa ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Anyị ga-agba mbọ ịhụ na anyị na-etinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ.—Jọn 13:17; Fil. 4:9.
2 Ịza Ajụjụ: N’usoro ihe omume nke afọ a, a tụkwasịrị otu minit n’oge ndị na-ege ntị ga-eji tinye ọnụ mgbe a na-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible. Nke a pụtara na nwanna nwoke e kenyere ịtụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible kwesịrị ịhụ na o mechara akụkụ nke ya na minit ise, ọ bụghịzi na minit isii. Ndị na-aza ajụjụ kwesịkwara ịhụ na ha agafeghị oge nke ha. Ọ bụrụ na onye na-aza ajụjụ echebara ajụjụ ya echiche tupu zawa ya, ọ pụrụ iji sekọnd 30 ma ọ bụ ihe na-erughị otú ahụ kwuo ihe a ga-erite uru na ya. Ihe dị ka mmadụ iri kwesịrị ịza ajụjụ ndị bara uru n’ime minit ise ahụ e wepụtara maka ndị na-ege ntị itinye ọnụ.
3 Okwu Ndị E Ji Ezi Ihe: Ọkà okwu nke ga-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible na nke ga-eme ihe omume nke 1 kwesịrị ilekwasị anya n’uru ihe ahụ ọ na-atụle bara n’ozi anyị nakwa n’ihe ndị ọzọ anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. O kwesịrị ime ihe karịrị nanị ịkpali ndị na-ege ntị inwe ọchịchọ ime ihe. O kwesịrị ikwu kpọmkwem ihe ndị ọ dị mkpa ka e mee, gosi otú a pụrụ isi mee ha, gosikwa uru ndị a ga-erite ma e mee ha. O mechaa ihe omume ya, ndị na-ege ntị kwesịrị inwe ike ịsị, “Lekwa otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ a si enye anyị nduzi,” ma ọ bụ “Lekwa ụzọ anyị pụrụ isi jiri amaokwu a mee ihe n’ozi.” Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụ́ ndị maara ọnọdụ ndị e nwere n’ọgbakọ ha kwesịrị ịgbalịsi ike ikwu kpọmkwem ụzọ ndị a pụrụ isi tinye ihe ahụ a na-atụle n’ọrụ.
4 Ihota ihe atụ ndị sitere na Bible pụrụ ịrụpụta ihe dị mma karịsịa mgbe a na-ekwu ụzọ a pụrụ isi tinye amaokwu Bible n’ọrụ. Mgbe ọkà okwu nyesịrị ihe atụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ọ pụrụ ikwu, sị, “Gị onwe gị pụkwara ịhụ onwe gị n’ọnọdụ yiri nke a.” O kwesịrị ijide n’aka na ụzọ ọ bụla o kwuru a pụrụ isi tinye ihe atụ ahụ sitere na Bible n’ọrụ kwekọrọ n’ihe a na-ekwu, kwekọọ n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Bible, kwekọọkwa n’ihe “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke kwekwara uche” bipụtarala.—Mat. 24:45.
5 Amamihe bụ inwe ike iji ihe ọmụma na nghọta mee ihe nke ọma. “Isi ihe ka amamihe bụ.” (Ilu 4:7) Ka anyị na-anọgide na-enweta ezi amamihe site n’ihe ndị anyị na-amụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ dịkwa nnọọ mma ka anyị na-emeziwanye nkà anyị n’ịkụziri ya ndị ọzọ.