Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Na-akụzi Ihe
1. Olee otú Jehova si jiri ihe ndị a na-ahụ anya kụziere ndị ohu ya nke oge ochie ihe, oleekwa mmetụta o nwere n’ahụ́ ha?
1 Iji mee ka ndị ohu ya nke oge ochie ghọta ihe ụfọdụ ndị dị mkpa, Jehova na-egosi ha ihe ndị ahụ n’ọhụụ ma ọ bụ ná nrọ. Chegodị echiche banyere ọhụụ Izikiel banyere ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova. (Ezik. 1:1-28) Jirigodị anya nke uche gị hụ ụdị mmetụta Daniel nwere mgbe ọ rọsịrị nrọ amụma ahụ na-egosi mpụta nke mba dị iche iche chịrị ụwa. (Dan. 7:1-15, 28) Gịnịkwanụ banyere ihe ndị na-akpali akpali e ji ‘ụzọ ihe atụ’ kpugheere Jọn onyeozi banyere ihe ndị ga-eme “n’ụbọchị Onyenwe anyị”? (Mkpu. 1:1, 10) Jehova ji ihe ndị na-acha ka ihe ha ma na ihe omume ndị dị ike kụziere ha ihe, ọ pụghịkwa ha apụ n’uche.
2. Olee ihe ndị a na-ahụ anya anyị pụrụ iji kụziere ndị ọzọ eziokwu Bible?
2 Ọ bụrụ na anyị onwe anyị achọọkwa ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible ka ha wee ghara ichefu ya ngwa ngwa, anyị pụrụ iji vidio anyị kụziere ha ihe. Vidio ndị anyị nwere na-egosi ọtụtụ ihe, na-eme ka obi ike anyị nwere na Bible, ná nzukọ Jehova, nakwa n’ụkpụrụ ndị na-eme ka anyị na-abụkwu ezi Ndị Kraịst, sikwuo ike. Tụlee ụzọ ole na ole anyị pụrụ isi jiri vidio anyị kụziere ndị ọzọ ihe. Vidio ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ndị a pụrụ iji mee ihe.
3. Gịnị ka ị pụrụ iji duru onye ị na-amụrụ Bible bịa ná nzukọ Jehova?
3 N’ozi Ubi: Ị̀ nọwo na-akọrọ onye ị na-amụrụ Bible banyere òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ? Jiri vidio bụ́ Our Whole Association of Brothers gosi ya ihe ị na-akọrọ ya. Nye ya vidio ahụ ka o kirie tupu oge ọzọ unu ga-amụ ihe ma ọ bụkwanụ gị na ya esoro kirie ya n’oge ọzọ unu ga-amụ ihe. Mgbe o kirisịrị ya, gị na ya tụlee ajụjụ ndị ahụ a jụrụ banyere ya n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2002.
4. Olee ngwá ọrụ bara uru Onyeàmà na-eto eto pụrụ iji kụzie ihe n’ụlọ akwụkwọ?
4 Ndị na-eto eto, unu pụrụ ịjụ ndị nkụzi unu ma hà ga-ekwe ka unu gosi ụmụ klas unu vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault ma ọ bụ Faithful Under Trials—Jehovah’s Witnesses in the Soviet Union. Jụọ ma ì nwere ike idepụta ajụjụ ndị unu ga-atụle edepụta. Ọ bụrụ na ha kwere, gị akwadebezie ajụjụ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2001 ma ọ bụ nke February 2003 otú e nwere ike isi jiri ya mee ihe na klas unu.
5. Olee ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ iji duzie ọmụmụ ihe ezinụlọ ha?
5 Mgbe Gị na Ndị Ezinụlọ Gị na Ndị Enyi Gị Nọ: Ndị mụrụ ụmụ, olee mgbe ikpeazụ ụmụ unu kiriri vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Gịnị ma unu kirighachi ya n’oge ọzọ unu ga-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ? N’Ozi Alaeze Anyị nke April 2002, e depụtara ajụjụ ntụleghachi ndị ga-eme ka mmadụ jiri obi ụtọ na obi ọcha kwuo ihe ọ mụtara.
6. Olee otú ị pụrụ isi hazie ka gị na ndị enyi gị nwee nnọkọ na-ewuli elu?
6 Ì nwere ndị enyi gị na ha nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị ị chọrọ ịkpọ ka ha bịa n’ụlọ gị? Gị na ha ikirikọ vidio bụ́ Respect Jehovah’s Authority ga-eme ka uhuruchi ahụ bụrụ nke na-ewuli elu, karịsịa ma ọ bụrụ na unu ejiri ajụjụ ndị e depụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2004 tụlee ihe ndị unu mụtara na ya.
7. Olee ebe ndị i chetara e nwere ike iji vidio anyị kụzie ihe?
7 Ebe Ndị Ọzọ: Olee ụzọ ndị ọzọ ị pụrụ isi jiri vidio 20 anyị nwere mee ihe? Ọ bụrụ na onye ị na-agakarị na nke ya ekirie otu ma ọ bụ abụọ n’ime vidio ndị ahụ, ọ̀ ga-enyere ya aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ? Ị̀ pụrụ ịnata ikike iji gosi vidio ndị a n’ebe a na-elekọta ndị agadi nakwa n’ogige ụmụ mgbei dị n’ógbè unu? Vidio ndị ahụ hà ga-eme ka ndị ikwu gị na-abụghị Ndịàmà, ndị agbata obi gị, na ndị ọrụ ibe gị kwanyewere gị ùgwù? Vidio anyị na-atọ ụtọ, na-akụzi ihe, bụrụkwa ihe nkiri ndị na-akụzi ihe n’ụzọ dị irè. Jiri ha na-akụzi ihe.