Na-echere Jehova
1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ distrikti nke afọ a, gịnịkwa mere isiokwu ahụ ji kwesị ekwesị?
1 Aịzaịa dere, sị: “Chineke nke ikpe ka Jehova bụ; ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị nile ndị na-echere Ya bụ.” (Aịsa. 30:18b) N’ọtụtụ ebe na Bible, e dere banyere otú Chineke si bibie ndị iro ya na otú o si napụta ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. Gịnị ka ihe ndekọ ndị dị otú ahụ na-akụziri ndị na-efe Jehova ofufe taa? Gịnị ka anyị pụrụ ime ugbu a iji dị njikere maka “ụbọchị Jehova . . . , bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu”? (Joel 2:31, 32) Mgbakọ distrikti anyị nke afọ a, nke isiokwu ya bụ “Nnapụta Dị Nso!,” ga-akpali anyị ichebara ajụjụ ndị ahụ echiche na iji ha nyochaa onwe anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ichere Jehova.
2. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka mgbakọ distrikti anyị?
2 Ì meela ndokwa iji gazuo ụbọchị atọ nke mgbakọ a ma rite uru na ha? Dị ka ihe atụ, ị̀ gakwurula onye were gị n’ọrụ iji nata ya ikike ịgha ọrụ n’ụbọchị ndị ahụ ka i wee nwee ike ịga? Ahapụkwala ime ndokwa maka ya. Tinye ya n’ekpere. I mesịa nke ahụ, ị gazie rịọ onye ahụ were gị n’ọrụ maka ya. (Neh. 2:4, 5) Anyị ekwesịghịkwa ịhapụ ime ndokwa maka ụgbọ njem, ụlọ obibi, na ihe ndị ọzọ dị mkpa ruo mgbe oge gacharala. Ime ndokwa dị mma otú ahụ na-egosi na anyị nwere nnọọ ekele maka nri ime mmụọ Jehova kwadebeere anyị. Ndị okenye kwesịrị ịchọpụta ndị chọrọ enyamaka iji gaa mgbakọ a, nke ka nke ndị agadi nọ n’ọgbakọ.—Gal. 6:10.
3. Olee àgwà ndị e kwesịrị iji mara ndị Jehova n’obodo ha gara mgbakọ na ya?
3 Àgwà Ọma Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ: Mgbe anyị gbakọtara n’ìgwè ná mgbakọ distrikti, àgwà ọma anyị na-agbara ndị bi n’obodo ahụ àmà. Gịnị ka nke a chọrọ anyị n’aka? Mgbe anyị nọ n’ebe e nyere anyị ụlọ n’ala mgbakọ, ma ọ bụ na họtel, ụlọ nri, nakwa n’ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-ere ahịa n’obodo anyị gara mgbakọ na ya, ndị anyị na ha ga-emekọ ihe kwesịrị inwe obi ụtọ n’ihi àgwà ọma ndị anyị ga-akpaso ha, àgwà ndị dị ka ogologo ntachi obi, ịdị nwayọọ, njide onwe onye, na ezi uche. (Gal. 5:22, 23; Fil. 4:5) Anyị nile kwesịrị igosipụta ụdị ịhụnanya ‘na-adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, nke na-adịghị achọ ọdịmma nke ya, nke a na-adịghịkwa akpasu iwe.’ Ọ bụrụgodị na anyị enwee ihe isi ike, anyị kwesịrị ime ihe nile “iji nye Chineke otuto.”—1 Kọr. 10:31; 13:5.
4. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịkpa àgwà n’ụzọ ga-ewetara Jehova otuto?
4 Mgbe e nwesịrị otu mgbakọ distrikti, àgwà na ejiji nke ndị ntorobịa anyị masịrị nnọọ manịja nke otu họtel nke na o kwupụtara ọchịchọ o nwere ịhụ na “ha ga na-anabata Ndịàmà Jehova mgbe nile na họtel ha.” Lee nnọọ ihe ọṅụ nke ahụ bụ! Nke a bụ n’ihi ọzụzụ na nlekọta unu bụ́ ndị nne na nna nyere ụmụ unu. Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya ma ndị nne na nna hapụ ụmụ ha ka ha nọrọ n’enweghị onye na-elebara ha anya. E kwesịrị ilebara ụmụaka anya nke ọma mgbe nile. (Ilu 29:15) Ka àgwà ọma ha wetara Jehova otuto ma mee ka obi ya ṅụrịa!—Ilu 27:11.
5. Olee otú anyị pụrụ isi jiri uwe na ejiji anyị sọpụrụ Jehova?
5 Uwe na Ejiji Kwesịrị Ekwesị: Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iso mee ka e lewe anyị anya ọma n’ebe anyị gara mgbakọ site n’izere iyi ụdị uwe, iji ụdị ejiji, na ime ụdị isi ndị na-ewu ewu, ndị ọ ga-abụ anyị gafee e lewe anyị, ndị na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ ndị dị gháá ghàà gháá n’anya. Ọ dịkwa mkpa iburu nke a n’uche mgbe anyị na-aga obodo anyị ga-anọ nwee mgbakọ na mgbe anyị na-ala ala, nakwa mgbe anyị si n’ebe e nyere anyị ụlọ na-aga n’ala mgbakọ. Dị ka ndị ohu Chineke, ihe mbụ anyị kwesịrị iburu n’uche bụ aha Jehova, ọ bụghị ihe ga-amasị anyị ma ọ bụ ihe ga-eme ka anyị tụsara ahụ́. Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị isi ezinụlọ ịhụ na ụdị ejiji onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ha ga-eji mgbe nile ga-abụ ụdị na-egosi na ha bụ ndị na-emeru ihe n’ókè na ndị nwere uche zuru okè.—1 Tim. 2:9.
6. Gịnị mere otú ahụ anyị si adị ùgwù n’oge ihe omume na-aga n’ihu n’ala mgbakọ si bụrụ otú anyị kwesịrị isi na-adị ùgwù n’oge anyị na-atụrụ ndụ?
6 Ọ dịkwa mkpa ịdị ùgwù mgbe anyị na-atụrụ ndụ n’ebe e nyere anyị ụlọ n’ala mgbakọ, ma ọ bụ mgbe anyị nọ na họtel, n’ụlọ ahịa, nakwa n’ụlọ nri. O kwesịrị ka anyị na-eji ejiji nke ọma mgbe anyị si n’ala mgbakọ pụọ n’oge e mechisịrị nnọkọ. Anyị iyi baajị mgbakọ anyị ga-eme ka anyị nwee ohere ịgbara ndị mmadụ àmà.—2 Kọr. 6:3, 4.
7. Olee otú anyị pụrụ isi soro mee ka mgbakọ distrikti a gaa n’usoro ma bụrụ nke na-enye ọṅụ? (Lee “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti.”)
7 Aịzaịa buru amụma, sị: “Jehova ga-echere, imere unu amara, ọ bụkwa n’ihi nke a ka a ga-ebuli Ya, inwe obi ebere n’ahụ́ unu.” (Aịsa. 30:18a) Obi ekele anyị nwere maka ebere na obiọma na-erughịrị anyị nke Jehova na-egosi anyị kwesịrị ịkpali anyị iji àgwà na ejiji anyị sọpụrụ ya mgbe anyị gbakọtara ná mgbakọ distrikti anyị. Ka Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” wetara Chineke anyị otuto ma nyere anyị aka ịnọ na-echere ya!
Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti
◼ Oge Ihe Omume Ga-amalite: N’ụbọchị Friday, ihe omume ga-amalite mgbe o ji nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ (9:20), ebe ọ ga-amalite kpọmkwem n’elekere itoolu nke ụtụtụ (9:00) n’ụbọchị Saturday na Sunday. Nkeji ole na ole tupu ihe omume amalite, onyeisi oche nnọkọ ahụ ga-anọdụ ala n’elu ikpo okwu ka a na-akpọ abụ olu ụtọ nke ga-eduga ná mmalite nnọkọ. Anyị nile kwesịrị ịnọdụ ala n’oge ahụ ka ihe omume ahụ wee nwee ike ịmalite n’ụzọ dị ùgwù. N’ụbọchị Friday, a ga-emechi ihe omume mgbe o ji nkeji ise gafee elekere ise nke uhuruchi (5:05), nke ụbọchị Saturday ga-abụ mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ na ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi (4:35), ebe nke Sunday ga-abụ mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi (3:40).
◼ Ịchọta Oche: Ndị ị pụrụ ịchọtara oche bụ nanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ.
◼ Nri Ehihie: Biko jiri nri ehihie gị bịa kama isi n’ala mgbakọ na-apụ n’oge nkwụsịtụ nke ehihie iji zụta ihe ị ga-eri. Ị pụrụ ịnọ n’ime ụlọ mgbakọ rie nri gị. Biko emetọsịla ebe ahụ, ma ọ bụ tụsa ihe ndị e ji kechie ihe n’ala. Ị pụrụ iji obere igbe nri nke pụrụ ịba n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e webata igbe nri ndị buru ibu na ihe ndị dị ka karama na-akụwa akụwa n’ime ụlọ mgbakọ. Biko cheta na ọ dịtụghị mma ịṅụ mmanya na-aba n’anya tupu a bịawa nzukọ Ndị Kraịst nakwa mgbe a na-arụ ọrụ ndị metụtara ofufe Chineke. N’ihi ya, e kwesịrị izere ya.
◼ Onyinye: Ime ndokwa maka mgbakọ distrikti na-efu nnukwu ego. Anyị pụrụ igosi ekele anyị nwere maka ya site n’inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ n’ala mgbakọ. N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e nyere n’onyinye ná mgbakọ distrikti a, e kwesịrị ide “Watch Tower” dị ka ndị ọ bụ ha ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Ọghọm na Ọnọdụ Mberede: Ọ bụrụ na e nwee onye nọ n’ala mgbakọ daa ọrịa nke chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ya, biko gwa onye atendantị nọ nso, bụ́ onye ga-eme ka ndị na-arụ n’Ebe Ịnara Ọgwụ mara ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara onye ọrịa ahụ anya ma nyere ya aka.
◼ Itinye Ihe A Na-ekwu na Teepu: E kwesịghị ịkwụnye ngwá ọ bụla e ji etinye ihe na teepu n’ebe a na-akwụnye ngwá eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị e ji eme ihe n’ala mgbakọ. A pụkwara iji ha mee ihe nanị n’ụzọ na-agaghị adọpụ uche ndị ọzọ.
◼ Ise Foto: Ọ bụrụ na ị chọrọ ise foto n’oge ihe omume na-aga n’ihu, biko ejila ọkụ foto mee ihe.
◼ Pager na Ekwe Ntị: E kwesịrị ịgbanyụlata ha otú ha na-agaghị adọpụ uche ndị mmadụ.
◼ Fọm A Ga-eji Mee Ihe Mgbe Mmadụ Gosiri Mmasị: E kwesịrị iji fọm Please Follow Up (S-43) depụta ihe banyere onye ọ bụla gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ mgbe anyị gbaara ya àmà n’oge anyị gara mgbakọ. Ndị nkwusa kwesịrị iji otu fọm Please Follow Up (S-43) ma ọ bụ abụọ bịa mgbakọ a. A ga-enwekwa fọm a ná Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ. Ị pụrụ iwega fọm nke i dejupụtarala edejupụta ná Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ ma ọ bụkwanụ gị enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu mgbe unu lọtara mgbakọ.
◼ Ihe Nkiri: Ọ ga-abụ ihe na-egosi ịhụnanya ma ọ bụrụ na ụmụnna nwanyị ahapụ iyi ịchafu isi ndị buru ibu n’ụtụtụ Sunday n’oge a ga-eme ihe nkiri, n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nọ ha n’azụ ghara ịhụ ihe a na-eme. Nke a dị mkpa karịsịa n’ihi ụzọ dị mfe e si rụọ ụfọdụ Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a na-anọ enwe mgbakọ.
◼ Ụlọ Obibi Ndị Dị n’Ala Mgbakọ: Gosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ị na-enweta ụlọ ozugbo ị bịarutere n’ala mgbakọ. Anọla n’ụlọ ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ngalaba Na-ahụ Maka Ebe Obibi nyere gị ya. Sie nri nanị n’ebe ndị a kwadoro ka a nọrọ na-esi nri. N’oge gara aga, a hụla ebe ụfọdụ ndị nọ na-esi nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Nke a adịghị egosi na ha nwere ekele maka ihe ime mmụọ.—Luk 10:38-42.