Na-eso Kraịst Site n’Igosi Nkwanye Ùgwù
1. Olee otú isiokwu nke mgbakọ distrikti nke afọ a si gbasa igosi nkwanye ùgwù?
1 Bible kọwara Eze Eluigwe na Ụwa, bụ́ Jehova, dị ka onye yi ebube na ịma mma dị ka uwe. (Ọma 104:1) N’oge nile, Jizọs kwuru okwu, meekwa omume n’ụzọ kwanyeere Nna ya na ndokwa dị iche iche Nna ya mere ùgwù. (Jọn 17:4) Onye ọ bụla n’ime anyị ga-enwe ohere iṅomi Jizọs na iwetara Jehova otuto ná Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke na-abịanụ.
2. Iji nọrọ ná nnọkọ nke ọ bụla, olee nkwadebe anyị ga-eme bụ́ ndị na-enye Jehova nsọpụrụ?
2 Ịkwanyere Ofufe Anyị Ùgwù: Anyị pụrụ igosi na anyị na-enye Jehova nsọpụrụ site n’ime ndokwa ịga rie oriri ime mmụọ a kwadebeere anyị. Ị̀ gwala onye were gị n’ọrụ ma dokwaa ihe omume gị iji gazuo abalị atọ a ga-enwe mgbakọ a, tinyere ụbọchị Friday? Ì meela atụmatụ irute n’ezi oge ka i wee nweta oche, soro bụọ abụọ mmeghe, nọrọkwa mgbe a na-ekpe ekpere mmeghe? Ì meela atụmatụ otú ị ga-esi rie nri ehihie ka gị na ụmụnna gị wee rie nri n’ebe a na-enwe mgbakọ ahụ? Mgbe ọ bụla nnọkọ nke ụtụtụ ma ọ bụ nke ehihie malitere, n’oge onyeisi oche ji obiọma gwa anyị ka anyị gaa n’oche anyị, anyị kwesịrị ịkwụsị ịkọrị akụkọ ozugbo wee nọdụ ala ka ihe omume malite.
3. Olee otú ịṅa ntị nke ọma n’ihe omume si akwanyere ofufe anyị ùgwù?
3 Ịṅa ntị nke ọma n’ihe omume na-enyekwa Nna anyị nke eluigwe nsọpụrụ. Mgbe otu onye nta akụkọ hụsịrị mgbakọ distrikti e mere n’ógbè ha, o dere na obi ga-atọ ndị gara ịhụ otú mgbakọ ahụ ga-adị ụtọ n’ihi “àgwà kwesịrị nṅomi nke ndị gara mgbakọ ahụ kpara, bụ́ ndị ji nkwanye ùgwù nọrọ jụụ gee ntị n’ihe a na-ekwu ma gosi na ihe ime mmụọ dị ha mkpa.” O kwukwara na ‘ụmụaka bịaranụ karịrị akarị . . . . ma ha nile kpara ezi àgwà karịa ka ụmụaka na-akpa ma ọ bụkwanụ ọbụna nọrọ na-asape Bible Nsọ.’ Ma, ọ dị mwute ikwu na n’ebe ụfọdụ e nwere mgbakọ distrikti n’afọ gara aga, e nwere ndị na-eto eto ụfọdụ a hụrụ ka ha na-akpagharị n’ụzọ ọhịa ruchiri, na-eme omume a na-enyo enyo. A hụrụ ka ndị ọzọ jidere ibe ha n’aka, gbakụọ ibe ha aka n’úkwù, kokwasị ibe ha aka n’olu. Ma ndị a ha si otú a jide abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha, nke ha ji abụ di ma ọ bụ nwunye ha. Omume a adịghị egosi nkwanye ùgwù e ji mara Ndị Kraịst. Oge ihe omume na-aga n’ihu abụghị mgbe anyị kwesịrị ịdị na-akọrị akụkọ, ma ọ bụ jiri ekwe ntị na-ezirịta ozi, ma ọ bụ na-eri nri, ma ọ bụkwanụ na-akpagharị. Ndị na-eto eto kwesịrị ka ha na ndị mụrụ ha nọrọ, ka ndị mụrụ ha wee nyere ha aka irite uru ná mgbakọ a. (Deut. 31:12; Ilu 29:15) Ime ụdị mgbalị a na-egosi na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, na-egosikwa na anyị nwere obi ekele maka nri ime mmụọ dị mkpa a na-enye anyị.
4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji dị ùgwù n’anya ná mgbakọ a?
4 Ịdị Ùgwù n’Anya: Ọtụtụ ndị gosiri na ha nwere obi ekele maka ihe ndị e chetaara anyị n’okwu e kwuru ná mgbakọ distrikti n’afọ gara aga nke bụ́, “Na-enwe Nsọpụrụ Mgbe Nile Dị Ka Onye Kraịst.” Okwu a kwusiri ike na ndị ohu Chineke kwesịrị ịgbalị na-egosi nkwanye ùgwù e ji mara Ndị Kraịst n’ejiji ha nakwa n’otú ha dị n’anya. N’afọ a, anyị kwesịkwara iji ihe ahụ e kwuru kpọrọ ihe. Otú anyị dị n’anya kwesịrị igosi otú obi dị anyị n’ebe Jehova nọ nakwa otú obi dị anyị banyere ihe ùgwù anyị nwere ịbụ Ndịàmà. Anyị kwesịrị iji ejiji mgbe nile dị ka “ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.”—1 Tim. 2:9, 10.
5. Olee otú anyị ga-esi dịrị ùgwù n’anya n’oge anyị na-atụrụ ndụ n’obodo a na-enwe mgbakọ?
5 Ọ̀ bụ nanị mgbe anyị na-aga ige ntị n’ihe omume ka anyị kwesịrị ịdị ùgwù n’anya? Cheta na ọtụtụ ndị ga-ahụ anyị ka anyị yi baajị mgbakọ n’obodo a na-enwe mgbakọ a. Otú anyị dị n’anya kwesịrị igosi na anyị dị iche n’ebe ọha mmadụ nọ. Ya mere, ọbụna n’oge ntụrụndụ, dị ka mgbe anyị na-aga iri nri n’oge ihe omume gwụchara, anyị kwesịrị ijikere otú kwesịrị ndị ozi bụ́ ndị bịara n’ebe ahụ ka ha gaa mgbakọ Ndị Kraịst. Anyị ekwesịghịkwa iyi uwe jeans, nịka, ma ọ bụ polo. Nke a ga-agba ezigbo àmà n’ógbè ahụ. Obi na-atọ Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na otú anyị dị n’anya na-egosi na anyị bụ ndị ozi ya.
6. Olee ihe ọma dị iche iche igosi nkwanye ùgwù e ji mara Ndị Kraịst na-arụpụta?
6 Ọ Ga-arụpụta Ihe Dị Mma: Igosi nkwanye ùgwù e ji mara Ndị Kraịst ná mgbakọ anyị na-enye anyị ohere ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi ọma. Ọ na-emekwa ka ndị na-ekiri anyị hụ ihe ọma ndị ha na-agaghị echefu ngwa ngwa. N’oge e mechara otu mgbakọ, otu onye ọrụ gọọmenti sịrị: “Anyị ahụtụbeghị ndị na-akpa ezigbo àgwà dị ka ndị a. Unu na-eme ihe otú Chineke chọrọ ka anyị na-eme.” Igosi nkwanye ùgwù na-eme ka ọ pụta ìhè na anyị na-asọpụrụ ibe anyị, hụkwa ibe anyị n’anya ma na-eto Jehova. (1 Pita 2:12) Ọ na-egosi na anyị na-atụ egwu Chineke nakwa na anyị nwere obi ekele maka ihe ùgwù nke ịbụ ndị Nna anyị na-enye ntụziaka. (Hib. 12:28) Ka anyị gbalịa igosi nkwanye ùgwù ka anyị na-atụ anya Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!”
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti
◼ Oge Ihe Omume Ga-amalite: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite n’elekere itoolu nke ụtụtụ. Nkeji ole na ole tupu ihe omume amalite, onyeisi oche nnọkọ ga-anọdụ ala n’elu ikpo okwu mgbe a kpọnyere abụ olu ụtọ e ji amalite nnọkọ. Anyị nile kwesịrị ịnọdụ ala n’oge ahụ ka ihe omume ahụ wee nwee ike ịmalite n’ụzọ dị ùgwù. A ga-emechi ihe omume nke ụbọchị Friday na Saturday mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ na ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi. Ma a ga-emechi ihe omume nke ụbọchị Sunday mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi.
◼ Ịchọtara Ndị Ọzọ Oche: I nwere ike ịchọtara ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ oche.
◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ebe a na-enwe mgbakọ a kama isi n’ebe ahụ na-apụ n’oge nkwụsịtụ nke ehihie ịga buru ya. I nwere ike iji obere igbe nri nke nwere ike ịba n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata igbe nri ndị buru oké ibu na ihe ndị na-akụwa akụwa n’ebe a na-enwe mgbakọ. A chọghịkwa ka e webata mmanya na-aba n’anya.
◼ Inye Onyinye: Ime ndokwa maka mgbakọ distrikti na-efu nnukwu ego. Anyị nwere ike igosi obi ekele anyị nwere maka ndokwa a site n’inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ ná mgbakọ distrikti. N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a ga-enye n’onyinye ná mgbakọ distrikti, e kwesịrị ide “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Ọghọm na Ihe Dapụtara na Mberede: Ọ bụrụ na e nwee onye nọ n’ala mgbakọ daa ọrịa nke e kwesịrị ime ihe ngwa ngwa banyere ya, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị a ga-eme ka ndị na-arụ n’Ebe Ịnara Ọgwụ mara ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara onye ahụ ahụ́ na-adịghị anya ma nyere ya aka.
◼ Saa Anya Mmiri Mgbe Ị Na-agba n’Okporo Ụzọ: Biko, kpachapụ anya mgbe ị na-agba n’okporo ụzọ. Rubekwa isi n’iwu okporo ụzọ mgbe ị na-abịa mgbakọ a na mgbe ị na-ala. Ndị Kraịst weere na ndụ dị nsọ. N’ihi ya, ha na-edebe iwu nile e nyere maka iji zere ihe ọghọm. (Ọma 36:9) Ụmụnna ndị na-ahụ maka ụgbọala ọgbakọ ji aga mgbakọ kwesịrị ịgba onye ọkwọ ụgbọala ume ka ọ ghara ịgba ọnwụ ọnwụ, kama, ka ọ saa anya mmiri nyaa ụgbọ ya otú ga-enyere ya aka izere ihe mberede okporo ụzọ.
◼ Itinye Ihe A Na-ekwu na Teepu: E kwesịghị ịkwụnye ihe ọ bụla e ji etinye ihe na teepu n’ọkụ eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị dị n’ala mgbakọ. E nwere ike itinye ihe ndị a na-eme na teepu. Ma, a ga-ahụ na e mere ya otú ọ na-agaghị adọpụ uche ndị ọzọ.
◼ Ise Foto: Ọ bụrụ na ị chọrọ ise foto n’oge ihe omume na-aga n’ihu, biko, gbanyụọ ọkụ kamera gị. Ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na onye ọ bụla agaa ise foto mgbe ihe omume na-aga n’ihu. E kwesịghịkwa ikwe ka ndị ji ise foto akpa ego bata n’ebe a na-enwe mgbakọ na-ese ndị mmadụ foto, ọ bụrụgodị na ha bụ Ndịàmà.
◼ Fọm A Ga-edejupụta Mgbe Mmadụ Gosiri Mmasị: E kwesịrị iji fọm Please Follow Up (S-43) dee banyere onye ọ bụla gosiri mmasị mgbe anyị gbaara ya àmà n’oge anyị gara mgbakọ distrikti. Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị iji otu fọm a ma ọ bụ abụọ bịa mgbakọ a. A ga-enwekwa fọm a ná Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ. I nwere ike iwegara Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ fọm nke i dejupụtara ma ọ bụkwanụ nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu mgbe unu lọtara.
◼ Ihe Nkiri: Iyi ịchafu ndị buru ibu n’oge a na-eme ihe nkiri na-eme ka ndị nọ n’azụ ghara ịhụ ihe a na-eme. N’ihi ya, ọ bụrụ na ụmụnna nwanyị ahapụ iyi ịchafu isi ndị buru ibu n’ehihie Sunday n’oge a ga-eme ihe nkiri, nke ahụ ga-egosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. Nke a dị mkpa karịsịa n’ihi ụzọ dị mfe e si rụọ ụfọdụ Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a pụrụ iji mee mgbakọ.
◼ Ụlọ Obibi: Gosi na i nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ị gara ka e nye gị ụlọ n’oge ị bịarutere n’ebe a na-enwe mgbakọ ahụ. Anọla n’ụlọ ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ngalaba Na-enye Ụlọ nyere gị ya. Gosi nkwanye ùgwù site n’ịnọ nanị n’ebe e nyere gị ụlọ. N’afọ gara aga, a hụrụ ndị nwoke na ndị nwanyị ole na ole ndị nọ n’ụlọ mgbakọ ruo mgbe chi jimiri, ọbụnakwa hie n’ebe ahụ. Nke a ekwesịghị ekwesị. O kwesịghịkwa ekwesị ka ụmụnna nwoke nọrọ n’ebe e nyere ndị nwanyị ụlọ ruo mgbe chi jimiri ma ọ bụ ọbụna hie n’ebe ahụ. Ụmụnna nwanyị ekwesịghịkwa ime nke a. Sie nri nanị n’ebe ndị a kwadoro ka a nọrọ na-esi nri. N’oge gara aga, a hụla ka ụfọdụ ndị na-esi nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Nke a adịghị egosi na ha nwere obi ekele maka ihe ime mmụọ.—Luk 10:38-42.