Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/06 p. 1
  • Ozi Ọma Anyị Na-ezi—Ọrụ Ọmịiko

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma Anyị Na-ezi—Ọrụ Ọmịiko
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Obi Ọmịiko nke Chineke Anyị”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Na-enwe Ọmịiko Ka Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “O Nwere Ọmịiko”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Jehova Ji Ọmịiko Na-achị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 6/06 p. 1

Ozi Ọma Anyị Na-ezi—Ọrụ Ọmịiko

1 Jizọs chọpụtara na ìgwè mmadụ ndị gere ntị n’ozi ya bụ ‘ndị a gbara akpụkpọ, chụsasịakwa dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Mat. 9:36) O ji olu dị nro na ịhụnanya kụziere ha ụkpụrụ Jehova, kasie ha obi, ma jiri ọmịiko gwa ha ihe ndị ha ga-eme ka ha na Chineke wee dị ná mma. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị Jizọs mere, anyị na-amụta iche echiche ka ya na inwe ụdị mmetụta o nwere, àgwà ọmịiko a na-apụtakwa ìhè n’ozi anyị.

2 Tụgharịgodị uche n’ihe Jizọs mere mgbe ndị nọ n’ọnọdụ dị oké njọ bịakwutere ya maka enyemaka. (Luk 5:12, 13; 8:43-48) O chebaara ndị nwere mkpa pụrụ iche echiche. (Mak 7:31-35) Ọ maara mmetụta ndị ọzọ na-enwe, o gosikwara na ya na-eche banyere ha. O leghị ihe anya otú mmadụ si ele ihe anya. (Luk 7:36-40) N’ezie, Jizọs gosipụtara nnọọ ụdị ọmịiko Chineke anyị nwere.

3 “O Nwere Ọmịiko”: Jizọs ejeghị ozi ya ka ọ bụkwara nnọọ na o mezuru iwu. “O nwere ọmịiko” n’ahụ́ ụmụ mmadụ. (Mak 6:34) N’otu aka ahụ taa, ihe anyị na-eme abụghị nanị ịhụ na anyị ziri ozi a gwara anyị zie, kama anyị na-agbalị ịhụ na a zọpụtara ndụ dị oké ọnụ ahịa. Gbalịa ịghọta ihe mere ndị mmadụ ji azaghachi otú ha si azaghachi. Gịnị mere ha ji enwe nchegbu ma ọ bụ nchekasị? Ọ̀ ga-abụ na ndị ndú okpukpe ụgha duhiere ha ma lefuru ha anya? Ezi mmasị anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ pụrụ ime ka ha gee ntị n’ozi ọma ahụ.—2 Kọr. 6:4, 6.

4 E gosi mmadụ ọmịiko, ọ na-emetụ onye ahụ n’obi. Iji maa atụ: Nwatakịrị nwanyị dị ọnwa atọ nwụnahụrụ otu nwanyị. Mgbe Ndịàmà abụọ rutere n’ụlọ nwanyị a, ọ nabatara ha. Ihe mekwaranụ o ji nabata ha bụ ka o gosi ha na ihe ha na-ekwu na ọ bụ ya mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, abụghị eziokwu. Ma, nwanyị ahụ mechara kwuo, sị: “Ha ji nnọọ ọmịiko gee m ntị, mgbe ha na-apụkwa, obi dị m ụtọ nke ukwuu nke na m kwere ka ha bịa ọzọ.” Ị̀ na-agba mbọ igosi na i nwere ọmịiko n’ebe onye ọ bụla i zutere n’ozi ubi nọ?

5 Inwe ọmịiko ga-enyere anyị aka ịkasi ndị ọzọ obi nke ọma. Ọ bụrụ na anyị na-eme ya, anyị na-eto “Nna nke obi ebere,” bụ́ Jehova.—2 Kọr. 1:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya