Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/06 p. 1
  • Ndị Na-adịghị Atụ Egwu, Ma Ha Na-eme Udo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-adịghị Atụ Egwu, Ma Ha Na-eme Udo
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ọ̀ Bara Uru Ịbụ Onye Na-eme Udo?
    Teta!—2006
  • “Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 11/06 p. 1

Ndị Na-adịghị Atụ Egwu, Ma Ha Na-eme Udo

1 Ọtụtụ ndị anyị na-ekwusara ozi ọma na-adị eji obi ọcha ha ekwupụta echiche ndị na-ekwekọghị n’eziokwu Bible. Ọ bụ eziokwu na anyị aghaghị ikwusa ozi ọma ahụ n’atụghị egwu, anyị na-achọkwa ka “anyị na mmadụ nile na-adị n’udo,” ma ghara ịkpachara anya na-akpasu ha iwe. (Rom 12:18; Ọrụ 4:29) Olee otú anyị pụrụ isi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’atụghị egwu, ma n’otu mgbe ahụ, na-ahụ na anyị na ndị mmadụ na-adị n’udo?

2 Chọpụta Ihe Unu Abụọ Kwekọrịtara na Ya: Onye na-eme udo na-ezere arụmụka. Anyị ịgbaghawa ihe onye nwe ụlọ kweere kemgbe ụwa agaghị eme ka ọ nakwere ihe anyị na-agwa ya. Ọ bụrụ na ihe o kwuru ezighị ezi, anyị nwere ike iji akọ hapụ ikwu ihe ọ bụla banyere ya ma mee ka okwu anyị hiwe isi n’ihe ọ pụrụ ịbụ na anyị na ya kwekọrịtara na ya. Ọ bụrụ na okwu anyị ehiwe isi n’ihe anyị na ya kwekọrịtara, nke a pụrụ ime ka obi dị ya mma, meekwa ka okwu anyị ruo ya n’obi.

3 Ọ bụrụ na anyị ahapụ ịgbazi onye nwe ụlọ mgbe o kwuru ihe na-ezighị ezi, ọ̀ pụtara na anyị adịghị agbachitere eziokwu ahụ ma ọ bụ na anyị na-agwagbu ya? Mba. Ọrụ anyị dị ka ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst abụghị ịgbagha echiche nile na-ezighị ezi ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere, kama ọ bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 24:14) Kama iwe iwe mgbe mmadụ kwupụtara echiche na-ezighị ezi, anyị pụrụ iwere ya dị ka ohere anyị nwere iji ghọta echiche onye ahụ.—Ilu 16:23.

4 Kwanyere Ha Ùgwù: E nwere oge anyị na-aghaghị iji obi ike gbaghaa ozizi ụgha n’atụghị egwu. Ma, dị ka ndị na-eme udo, anyị kwesịrị izere ịkwa ndị kweere n’ozizi ụgha ma na-akụzi ya emo, anyị kwesịkwara izere ịkparị ha. Mmadụ ime ka ọ̀ ka ndị ọzọ na-eme ka ndị mmadụ gbawara ya ọsọ, ma mmadụ ịdị obi umeala na obiọma na-eme ka ndị hụrụ eziokwu n’anya nabata okwu ya. Ọ bụrụ na anyị akwanyere ma ndị na-ege anyị ntị ma ihe ndị ha kweere ùgwù, nke a ga-eme ka ha nwee ùgwù, meekwa ka ọ dịkwuoro ha mfe ịnabata ozi anyị ji bịa.

5 Pọl onyeozi chebaara ihe ndị o kwusaara ozi ọma kweere echiche ma gbalịa ikwusara ha ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi. (Ọrụ 17:22-31) O ji obi ya nile ‘ghọọ ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ,’ ka o “wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.” (1 Kọr. 9:22) Anyị pụrụ ime otu ihe ahụ site n’ịbụ ndị na-eme udo ka anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ n’atụghị egwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya