Na-agbaso Ihe Nlereanya Kraịst Setịpụrụ n’Ihe Banyere Ikwusa Ozi Ọma
1 Jizọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya anyị ga-agbaso n’ihe banyere ikwusa ozi ọma. O gosiri ezigbo ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke na ndị mmadụ nọ ọtụtụ ugboro nakwa n’ụzọ dị iche iche. Ọ kụziiri ndị dị umeala n’obi eziokwu ahụ, nyekwara ndị na-ata ahụhụ na ndị e wedara n’ala aka.—Mat. 9:35.
2 Ihe Nlereanya Jizọs na Ozizi Ya: Ka e wee ghara ịdọpụ uche Jizọs n’ọrụ ikwusa ozi ọma, o kweghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ sonyere ndị ọrụ ebere ná mgbalị ha na-eme iji mee ka obodo ka mma. O kweghịkwa ka ihe ọ bụla ọzọ e ji ezi obi eme dọpụ uche ya ma ọ bụ mee ka ọ ghara ibute ọrụ bụ́ isi ọ bịara ịrụ ụzọ. (Luk 8:1) O lekwasịrị anya n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke dị ka ihe ga-akwụsị nsogbu nile ụmụ mmadụ nwere kpamkpam. Jizọs nwere nnukwu ọrụ ọ ga-arụ, ma oge o nwere iji rụọ ya dị obere. Mgbe ndị Kapaniọm chọrọ ka Jizọs nọgide n’obodo ha, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ . . . ka m wee meekwa nkwusa n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi nzube a ka m jiworo pụta.”—Mak 1:38.
3 Mgbe Jizọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ, o zipụrụ ha ma gwa ha hoo haa, sị: “Na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze nke eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:7) Ọ kụziiri ụmụazụ ya na ha kwesịrị ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ha. (Mat. 6:33) Okwu ikpeazụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya tupu ya alaghachi n’eluigwe mere ka ha ghọta ihe ha kwesịrị ime. Ọ gwara ha, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Mat. 28:19.
4 Ihe Mere Alaeze Ahụ Ji Dị Mkpa: Isi ihe Jizọs kwusara bụ Alaeze Chineke, ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbasoo ihe nlereanya ya. Mgbalị nile ụmụ mmadụ na-eme iji kwụsị nsogbu ha agaghị enwe isi. (Jer. 10:23) Ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-edo aha Chineke nsọ ma mee ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha kpamkpam. (Mat. 6:9, 10) Ịkụziri ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme,” eziokwu Alaeze ahụ na-enyere ha aka ibi ndụ obi ụtọ na nke na-aga nke ọma, ọ na-enyekwara ha aka inwe olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu.—Ezik. 9:4.
5 Jizọs ewepụbeghị aka ya n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ na-emesikwa anyị obi ike na ya ga na-akwado anyị. (Mat. 28:20) Ruo ókè ha aṅaa ka anyị na-agbasoru ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị mgbe anyị na-eje ozi ubi? (1 Pita 2:21) N’ụbọchị ikpeazụ ndị a siri oké ike, ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji na-agbasochi ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị anya n’ihe banyere ikwusa ozi ọma!