Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/07 p. 1
  • Ọ “Na-enye Onye Dara Mbà Ike”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ “Na-enye Onye Dara Mbà Ike”
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-enye Onye Ike Gwụrụ Ume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jehova Na-enye Onye Dara Mbà Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Ọ Na-eme Ka Onye Ike Gwụrụ Nwee Ike”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • ‘Ndị E Ji Okwu Okwukwe Zụọ’
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 5/07 p. 1

Ọ “Na-enye Onye Dara Mbà Ike”

1 Ike na-agwụ anyị nile site n’oge ruo n’oge. Ọ bụghị nanị mgbe anyị rụrụ ọrụ ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ e ji ike ọkpụkpụ aka eme ka ike na-agwụ anyị, kama ike pụkwara ịgwụ anyị mgbe anyị nwetara nsogbu ‘n’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Tim. 3:1) Dị ka ndị ohu Jehova, olee otú anyị si enweta ike n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ nke dị anyị mkpa iji ghara ịkwụsịlata ozi anyị? Anyị na-eme ya site n’ịdabere n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye ahụ nke “nwere ume n’ike.” (Aịsa. 40:26) Ọ maara ihe ndị na-akpa anyị, ọ na-amasịkwa ya nke ukwuu inyere anyị aka.—1 Pita 5:7.

2 Ndokwa Jehova Mere: Jehova na-eji mmụọ nsọ ya, nke bụ́ ikike ahụ na-enweghị atụ o ji kee eluigwe na ala, eme ka anyị nwetaghachi ike. Mmụọ Chineke na-enyere anyị aka ‘ịgbanwe ike,’ ma ọ bụ inwetaghachi ike, ma ike gwụ anyị. (Aịsa. 40:31) Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee mgbe ikpeazụ m rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nye m mmụọ nsọ ya ka m wee nwetaghachi ike iji rụzuo ọrụ ndị dịịrị m dị ka Onye Kraịst?’—Luk 11:11-13.

3 Ọ bụrụ na anyị na-agụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche na ya, na-enwetakwa ike n’ụzọ ime mmụọ site n’ịdị na-agụchi akwụkwọ ndị anyị ji amụ Bible anya, anyị ga-adị ka ọmarịcha “osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ.”—Ọma 1:2, 3.

4 Jehova na-ejikwa ndị kwere ekwe ibe anyị, bụ́ ndị pụrụ ịbụ “ndị enyemaka na-eme ka [anyị] dị ike,” enyere anyị aka. (Kọl. 4:10, 11) Ha na-eji mkparịta ụka na-ewuli elu anyị na ha na-enwe ná nzukọ ọgbakọ, ajụjụ ha na-aza, na ihe omume ndị ha na-eme n’ọgbakọ, eme ka anyị dị ike. (Ọrụ 15:32) Ndị okenye ọgbakọ karịsịa na-enyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ, na-enyekwa anyị agbamume ndị na-eme ka anyị nwetaghachi ike.—Aịsa. 32:1, 2.

5 Ozi Ọma: Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ike ọ̀ gwụwala gị, akwụsịla ịga ozi ọma! Ozi ọma adịghị ka ọrụ ndị ọzọ anyị na-arụ. Ọ bụrụ na anyị na-agachi ya anya, anyị ga na-enweta ume ọhụrụ n’ezie. (Mat. 11:28-30) Ikwusa ozi ọma na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’Alaeze Chineke na iburu mgbe ebighị ebi na ngọzi ndị ya na ha so aga n’uche.

6 E nwere ọtụtụ ọrụ a ka ga-arụ tupu e bibie ajọ usoro ihe a. Anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji nọgidesie ike n’ozi anyị, “na-adabere n’ike nke Chineke na-enye.” (1 Pita 4:11) Site n’enyemaka Jehova, anyị ga-arụcha ọrụ a e nyere anyị, n’ihi na Jehova “na-enye onye dara mbà ike.”—Aịsa. 40:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya