Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche July 15
“Ọ bụrụ na onye mmadụ hụrụ n’anya anwụọ, ọ na-ewute onye ahụ nke ukwuu. Ma, ì chere na o nwere akụkụ ahụ́ onye ahụ nwụrụ anwụ nke na-adịgide ndụ mgbe onye ahụ nwụsịrị? [Chere ka ọ zaa.] Legodị nkwa ọma Jizọs kwere. [Gụọ Jọn 5:28, 29.] Ebe ọ bụ na Jizọs kwuru na oge na-abịa mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, magazin a na-akọwa site na Bible ebe ndị nwụrụ anwụ nọ ugbu a.”
Ụlọ Nche Aug. 1
“Aga m achọ ịma ihe bụ́ echiche gị banyere ihe a Jizọs kwuru. [Gụọ Matiu 5:3.] Ì chere na mmadụ ịma mkpa ime mmụọ ya na igbo ya, ga-ewetara onye ahụ obi ụtọ? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-ekwu ihe Bible sịrị na ọ bụ ya bụ mkpa ime mmụọ anyị, na otú anyị pụrụ isi gboo ya.”
Teta! July–Sept.
“Ụfọdụ mmadụ bara ọgaranya ebe ọtụtụ ijeri mmadụ dara ogbenye. Ma, ì chere na ọ dị mgbe mmadụ nile ga-emecha hara otu? [Chere ka ọ zaa.] Lee otú Chineke si ele ndị ogbenye anya. [Gụọ Abụ Ọma 22:24.] Magazin a na-akọwa ihe Bible kwuru bụ́ olileanya ndị ogbenye nwere.”
Ì chere na Chineke eburula ụzọ kpebie ụdị omume anyị ga na-eme na ihe ga-abụ akara aka anyị? [Chere ka ọ zaa.] Dị ka akụkụ Bible a m ga-agụrụ gị si kwuo, Chineke na-ahapụ ndị mmadụ ka ha jiri aka ha họrọ otú ha chọrọ isi bie ndụ ha. [Gụọ Deuterọnọmi 30:19.] Isiokwu a na-akọwa ihe Bible nwere ikwu n’okwu a.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 12.