Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche July 15
“Ì chere na a ga-emecha nwee ọchịchị ga-agwọta nsogbu ụmụ mmadụ? [Chere ka ọ zaa.] Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere ka ọchịchị dị otú ahụ bịa mgbe o kwuru ihe e dekọrọ na Matiu 6:9, 10. [Gụọ.] Magazin a na-akọwa ihe mere Alaeze Chineke ji ka ọchịchị ụmụ mmadụ mma nakwa ngọzi Alaeze ahụ ga-ewetara ụmụ mmadụ.”
Ụlọ Nche Aug. 1
“N’ụwa taa, a na-ahụkarị ebe ụmụ mmadụ na-emegbu ibe ha. Ì chere na mmegbu ga-akwụsịlata ma e nwekwuo ndị na-etinye okwu Jizọs a n’ọrụ? [Gụọ Matiu 7:12. Ị gụsịa ya, chere ka ọ zaa.] Magazin a na-akọ ihe Bible kwuru na ọ bụ otú mmadụ ga-esi nweta ùgwù ruuru ya.”
Teta! July-Sept.
“Ì chetụla banyere ihe mere anyị ji aka nká? [Chere ka ọ zaa.] Ihe Bible kwuru na ọ bụ ya mere anyị ji aka nká na-egosi otú Chineke sirila mee ka o kwe anyị omume inwe ndụ ebighị ebi.” [Gụọ Aịsaịa 25:8.] Teta! a kwuru ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ya mere anyị ji aka nká.”
“Ụfọdụ ndị kweere na, ka mmadụ wee nwee ihe ịga nke ọma n’ụwa anyị a, ọ ga-abụrịrị onye na-eme ihe ike ike. Ma, kama ikwu otú ahụ, lee ihe Jizọs tụrụ aro ka e mee. [Gụọ Matiu 5:5, 9.] Ì kwenyere n’ihe a Jizọs kwuru? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a kwuru uru atọ a na-erite n’ime udo.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 26.