Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/08 p. 6
  • Ị̀ Na-eyigharị Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-eyigharị Ya?
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-eyigharị Ya?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Vidio nke Na-eme Ka Otu Ụzọ Dị Mkpa E Si Agwọ Ọrịa Pụta Ìhè
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Vidio nke Na-eme Ka Otu Ụzọ Dị Mkpa E Sizi Agwọ Ọrịa Pụta Ìhè
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ì Kpebiela Otú Ị Chọrọ Ka E Si Gwọọ Gị ma Ihe Gbata Gbata Mee?
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 1/08 p. 6

Ị̀ Na-eyigharị Ya?

Iyigharị gịnị? Ọ bụ idejupụta kaadị DPA (durable power of attorney) a na-enye Ndịàmà Jehova e merela baptizim. Ebe ọ bụ na ‘ị maghị ihe ndụ gị ga-abụ echi,’ ọ dị ezigbo mkpa ka i buru ụzọ kpebie otú ị ga-achọ ka e si gwọọ gị mgbe ị nọ n’ọnọdụ mberede ma detuo ya edetuo. (Jems 4:14; Ọrụ 15:28, 29) Iji nyere gị aka, e wepụtala vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights. Lee ya, chebakwara ihe ndị ị mụtara echiche ma kpee ekpere banyere ha.—Buru nke a n’uche: Ebe ọ bụ na vidio ahụ nwere ebe ụfọdụ e gositụrụ ebe a na-awa ahụ́, ndị nne na nna kwesịrị ikpebi otú ha na ụmụ ha ga-esi lee vidio a.

(1) Olee ihe mere ụfọdụ ndị dọkịta ji na-agbanwe echiche ha banyere mmịnye ọbara? (2) Nye ihe atụ ụdị ịwa ahụ́ atọ chọrọ mkpachara anya a wara n’amịnyeghị ndị a wara ha ọbara. (3) Ndị dọkịta ole gburugburu ụwa kwurula na ha dị njikere ịgwọ ndị ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara? Olee ihe mere ha ji dị njikere ime ya? (4) Olee ihe nnyocha e mere n’ụlọ ọgwụ dị iche iche n’oge na-adịbeghị anya gosiri banyere ọbara a na-amịnyere ndị mmadụ? (5) Olee nsogbu ndị onye ọrịa nwere ike inwe ma a mịnye ya ọbara? (6) Olee ihe ndị ọkachamara ụfọdụ kwubirila banyere uru ọ bara ịgwọ ndị mmadụ n’ejighị ọbara? (7) Olee ihe na-akpata ụkọ ọbara n’ahụ́ mmadụ? Ọ̀ na-egbu mmadụ ozugbo? Olee ihe e nwere ike ime iji nyere onye ọbara kọrọ n’ahụ́ aka? (8) Olee otú e nwere ike isi mee ka ahụ́ onye ọrịa mepụtakwuo mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara? (9) Olee ụzọ ndị e si eme ka ọbara ghara ịgbafusị mgbe a na-awa mmadụ ahụ́? (10) È nwere ike ịgwọ ụmụaka ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa nwere ike igbu mmadụ n’amịnyeghị ha ọbara? (11) Gịnị bụ otu n’ime ụkpụrụ ndị bụ́ isi a na-agbaso n’ịgwọ ndị mmadụ ọrịa? (12) Olee ihe mere o ji dị mkpa ka Ndị Kraịst kpebie otú a ga-esi gwọọ ha n’amịnyeghị ha ọbara tupu ha adaa ọrịa? Olee otú anyị nwere ike isi mee nke a?

Onye ọ bụla ga-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie ma ọ̀ ga-anabata ụfọdụ ọgwụgwọ e gosiri na vidio ahụ. Ì kpebiela kpọmkwem ụdị ọgwụgwọ ndị gị na ụmụ gị ga-anabata? Ị chọọ ịgụ ebe a kọwara ihe ndị a nke ọma, lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” ndị dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 2004, na October 15, 2000, na ihe ntinye bụ́ “Olee Ihe M Kwesịrị Ikpebi Ma A Chọọ Iji Ọbara M Gwọọ M Ọrịa Nakwa Ma A Chọọ Iji Ihe E Si n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Mejupụtara Ọbara Nweta, Gwọọ M Ọrịa?” bụ́ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2006. I kwesịrị ime ka onye ị họọrọ ikwuchitere gị ọnụ gị n’ọnọdụ mberede na ndị ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà mata nnọọ ihe niile i kpebiri.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya