Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/08 p. 4
  • I Nwere Ike Inweta Akụnụba!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • I Nwere Ike Inweta Akụnụba!
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ikpebisi Ike Ịba Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ
    Teta!—2007
  • Ohere Ịsụ Ụzọ Ò Megheworo Gị Ugbu A?
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 5/08 p. 4

I Nwere Ike Inweta Akụnụba!

1. Olee ihe mere mmadụ ga-eji chebara ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile echiche?

1 Ị̀ chọrọ inwekwu ọṅụ na afọ ojuju ná ndụ gị? Ọ̀ na-atọ gị ụtọ ma na-eju gị afọ inyere ndị ọzọ aka? Ị̀ chọrọ ịmụba oge i ji ejere Jehova ozi? Ọ bụrụ na o nwere nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a ị zara ee, i kwesịrị iche echiche banyere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. O doro anya na tupu mmadụ ewere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, ọ ghaghị ichebara ibu ọrụ ezinụlọ na ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ ndị o nwere echiche, cheekwa banyere ahụ́ ike ya na ihe ndị ọ ga-emeli iji mara ma ọ̀ ga-arụli ya.

2. Kwuo akụnụba ime mmụọ ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ na-enweta.

2 Ihe Sọlọmọn ji ike mmụọ nsọ dee gosiri na e nwere ihe jikọrọ ngọzi Jehova na akụnụba. (Ilu 10:22) Taa, ihe bụ́ isi mmadụ na-enweta ma Jehova gọzie ya bụ akụnụba ime mmụọ. Ndị ọsụ ụzọ oge niile na-enweta akụnụba dị otú ahụ n’ụba. Dị ka ihe atụ, ha na-enweta obi ụtọ ka ukwuu na-esite n’inye ndị ọzọ ihe ka ha ‘na-azụtara onwe ha oge’ site n’ihe ndị ha gaara achọ iji oge ha eme. (Kọl. 4:5; Ọrụ 20:35) Jehova na-ahụ ọrụ ịhụnanya ha na-arụ, ọ na-emekwa ya obi ụtọ. Ọ dịghị mgbe ‘akụ̀ ndị dị otú ahụ a kpakọbara n’eluigwe’ na-agaghị adịkwa oké ọnụ ahịa. (Mat. 6:20; Hib. 6:10) Ọzọkwa, ka ndị ọsụ ụzọ ‘na-elegide anya otu ebe’ ma na-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa, otú ahụ ka mmekọrịta ha na ya ga na-esiwanye ike.—Mat. 6:22, 25, 32; Hib. 13:5, 6.

3. Olee otú ịchụso akụnụba ime mmụọ si dị iche n’ịchụso akụnụba nkịtị?

3 Ịchụso akụnụba nkịtị na-edugakarị ‘n’ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́.’ (1 Tim. 6:9, 10; Jems 5:1-3) Ọ dịtụghị mgbe ngọzi Jehova ga-eduga n’ihe ndị dị otú ahụ. Oge buru ibu ndị ọsụ ụzọ na-etinye n’ozi na-enyere ha aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma na-eburu ihe ndị ka mkpa n’uche. (Fil. 1:10) Otu nwanna nwoke hapụrụ ọrụ injinia ọ na-arụ, bụ́ nke na-ewekọrọ oge ya niile, ma malite ịsụ ụzọ. O kwuru, sị: “Ọrụ ego m na-agwụ m ike. Ma, ọrụ ọsụ ụzọ na-atọ m ụtọ. M na-enwezi ike inyere ndị mmadụ aka ma kụziere ha eziokwu ahụ. Nke a emeela ka m nwekwuo afọ ojuju na obi ụtọ.”

4. Olee otú ndị ọsụ ụzọ oge niile si enweta ngọzi ka ha na-abụrụ ndị ọzọ ngọzi?

4 Ịbụrụ Ndị Ọzọ Ngọzi: Taa, “oge dị oké egwu, nke tara akpụ” na-emetụta onye ọ bụla. (2 Tim. 3:1) N’ụwa niile, ụmụ mmadụ na-achọsi olileanya ike. Ndị nkwusa Alaeze na-enwe obi ụtọ ịhụ ka ndị na-enweghị olileanya ha ziri ozi ọma na-amalitezi inwe olileanya. Ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị na-etinye ihe karịrị narị awa asatọ n’ozi kwa afọ, na-enwe nnọọ ụdị ọṅụ ahụ n’ụba!—1 Tim. 4:16.

5, 6. Olee ihe nwere ike inyere gị aka ịghọ ọsụ ụzọ oge niile?

5 Ị̀ na-echesi echiche ike ma ị̀ ga-arụli ọrụ ọsụ ụzọ oge niile? Ihe o nwere ike ịchọ gị n’aka bụ ‘ịzụtara onwe gị oge’ site n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa ị na-eme. (Efe. 5:15, 16) Ọtụtụ ndị emeela otú ahụ ma mee ka ndụ ha dị mfe, bụ́ nke nyeerela ha aka igbubilata oge ha na-eji arụ ọrụ ego ma tinyekwuo oge ha n’ozi Alaeze ahụ. Ì nwere ike ịhazi oge gị ma sonyere ha?

6 Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe ga-enyere gị aka ịhazigharị oge gị otú ọ ga-ekwe gị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. (Jems 1:5) Olee ngọzi ndị ị pụrụ ịtụ anya inweta? Ị pụrụ ịtụ anya inweta ngọzi ime mmụọ n’ụba! Jehova ga-agọzikwa gị site n’inye gị ihe anụ ahụ́ ndị dị gị mkpa. (Mat. 6:33) Ndị si otú a nwalee Jehova ga-enweta “ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ” ha.—Mal. 3:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya