Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/08 p. 4
  • Ị̀ Na-eji Ya Eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-eji Ya Eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu?
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọhụrụ nke Ga-enyere Anyị Aka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mgbanwe Ndị Magburu Onwe Ha A Ga-eme n’Ụlọ Nche!
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ọhụrụ nke Ga Na-agba n’Ụlọ Nche
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 8/08 p. 4

Ị̀ Na-eji Ya Eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu?

1 “Ọ na-agụsi m agụụ ike iji ya aga ozi ọma!” Nke ahụ bụ ihe otu nwanna nwaanyị dere mgbe ọ gụchara Ụlọ Nche January 1, 2008. Ị̀ tụleela ụfọdụ n’ime ihe ndị na-adị n’Ụlọ Nche nke ọhaneze, ị̀ chọpụtakwala otú ị ga-esi jiri ha na-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị na magazin ahụ n’ozi ubi?

2 “Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs”: Ikekwe, ị chọpụtala na isiokwu a na-enye aka ịmalite ọmụmụ Baịbụl. Ya bụrụ na ị gụtụbeereghị onye nwe ụlọ isiokwu ahụ ma gosi ya ihe Jizọs kwuru banyere okwu ahụ bụ́ nke dị na paragraf nke mbụ, nwaleekwala ya. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enwee mmasị, gbalịa iwere nkwurịta okwu ahụ gaa n’ihu site n’ịgụ isiokwu nta ndị dị na ya, bụ́ ndị e dere n’ụdị ajụjụ ndị na-eme ka mmadụ chee echiche. Gwa onye ahụ ka ọ zaa ajụjụ ahụ. Jiri obere oge kọwaa foto ọ bụla metụtara ihe unu na-amụ ma gafezie na paragraf na-esonụ. Unu nwere ike ịmụcha ọkara nke isiokwu ahụ n’oge mbụ ahụ ị gara na nke onye nwe ụlọ, mụzie nke fọrọ mgbe ọzọ ị ga-aga. Dị njikere iji akwụkwọ Bible Na-akụzi gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ.

3 “Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ”: A haziri usoro isiokwu a, bụ́ nke na-agba otu ugboro n’ọnwa atọ, iji nyere ndị di, ndị nwunye, na ndị nne na nna aka ịhụ otú ha ga-esi gbasoo ụkpụrụ Baịbụl mgbe ha na-edozi nsogbu ndị na-achọ iweta ọgba aghara n’ezinụlọ ha. I nwekwara ike iji isiokwu ndị a nyere ndị na-abụghị Ndịàmà aka ịhụ okwu amamihe ndị dị na Baịbụl.—2 Tim. 3:16, 17.

4 Isiokwu Ndị E Bipụtara Maka Ụmụaka: E dere isiokwu bụ́ “Maka Ndị Na-eto Eto” otú ndị na-eto eto nwere ike isi kwuo echiche ha ka a na-atụle otu isiokwu sitere na Baịbụl. I nwere ike iji isiokwu ndị a nyere ndị na-eto eto ị hụrụ mgbe ị nọ n’ozi ọma aka ịhụ uru ọ bara ịmụ Okwu Chineke. (Ọma 119:9, 105) Mgbe ị na-akụziri ndị nne na nna ihe, i nwere ike iji isiokwu bụ́ “Kụziere Ụmụ Gị Ihe” mee ya, bụ́ nke na-apụta kwa ọnwa abụọ. Isiokwu ndị a nwere ike inyere ụmụaka aka ịmụta ihe ndị dị mkpa site n’akụkọ nke ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ì wepụtala oge soro ụmụ gị gụọ isiokwu ndị a?

5 Isiokwu Ndị Ọzọ: Kwa ọnwa, isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ” na-atụle ajụjụ ndị na-abụghị Ndịàmà nwere ike ịjụ. I nwere ike igosi onye nwe ụlọ isiokwu a mgbe ị na-enyefe magazin site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Isiokwu bụ́ “Akwụkwọ Ozi Si . . . ” bụ akụkọ doro anya mmadụ kọrọ banyere onwe ya, bụ́ nke na-egosi nsogbu ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ na-enwe n’ozi ha. Isiokwu ndị a nwere ike inyere ndị nwere mmasị aka ịhụ na a na-ezisa ozi ọma n’ụwa niile, nke bụ́ ihe àmà nke ọnụnọ Kraịst.—Matiu 24:3, 14.

6 Isiokwu na-agba kwa ọnwa bụ́ “Bịaruo Chineke Nso,” nke dabeere n’ọgụgụ Baịbụl a na-enwe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nwere ike ime ka ndị nwere ezi mmasị chọọ ịmụtakwu banyere Jehova. A kwadebere isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke na-agba ugboro anọ n’afọ, iji nyere ndị mmadụ aka iji anya nke uche ha hụ ihe ndị a kọrọ na Baịbụl, ọ na-emekwa ka ndị na-agụ Baịbụl n’oge a ghọtakwuo ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nke ọma—ghọta ihe ndị na-amasị ha, ihe isi ike ndị ha nwere, na okwukwe ha.

7 Obi dị anyị nnọọ ụtọ na n’ọnwa ọ bụla, anyị na-enweta otu Ụlọ Nche nke a kwadebere maka iji ya aga ozi! Ka anyị gbalịsie ike ịdị na-aghọta ihe ndị dị na ha nke ọma ma jiri ha na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu n’ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya