Isiokwu Ọhụrụ nke Ga Na-agba n’Ụlọ Nche
Na Satọdee mbụ n’ọnwa ọ bụla, anyị na-eji isiokwu bụ́ “Mụta Ihe n’Okwu Chineke” amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Isiokwu a na-adị n’Ụlọ Nche. Ma malite na Jenụwarị, anyị ga-akwụsị ide isiokwu a. A ga-eji isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” dochie ya. Ọ ga-adị na peeji ikpeazụ n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. Anyị ga-ejizi ya na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl otú ahụ anyị si eji isiokwu bụ́ “Mụta Ihe n’Okwu Chineke.” (km 12/10 p. 2) A ka ga na-ede otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa ọ bụla n’Ozi Alaeze Anyị.