Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/09 p. 2
  • ‘Na-eme Ihe Niile n’Ihi Ozi Ọma’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Na-eme Ihe Niile n’Ihi Ozi Ọma’
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-eji Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ya Ezi Ha Ozi Ọma?
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ì Nwere Ike Ịhazigharị Oge Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Iji Ozi Ọma ahụ Gakwuru Ọtụtụ Mmadụ Dị Ka O Kwere Mee
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ị̀ Dị Njikere Ịbụ Onye Na-akụta Mmadụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 2/09 p. 2

‘Na-eme Ihe Niile n’Ihi Ozi Ọma’

1. Olee ihe onye na-ekwusa ozi ọma Alaeze na-agba mbọ imere ndị ọzọ, ọ̀ bụkwa maka gịnị?

1 Pọl onyeozi weere na ọ bụ ọrụ dịịrị ya ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. (1 Kọr. 9:16, 19, 23) N’otu aka ahụ, ihe mere anyị ji agba mbọ na-aga ezisara ndị mmadụ ozi ọma bụ n’ihi na anyị chọrọ ka ha nweta ndụ ebighị ebi.

2. Olee otú anyị nwere ike isi hazigharịa oge anyị ji ezi ozi ọma, ọ̀ bụkwa maka gịnị?

2 Kwusaa Ozi Ọma n’Ebe A Ga-ahụ Ndị Mmadụ na n’Oge A Ga-ahụ Ha: Onye maara egbu azụ̀ anaghị awụnye ụgbụ ya ebe masịrị ya ma ọ bụ gawa igbu azụ̀ n’oge kaara ya mma, kama ọ na-aga ebe ọ ga-egbute azụ̀ nakwa n’oge o yikarịrị ka ọ̀ ga-egbute azụ̀. Ebe anyị bụ “ndị na-akụta mmadụ,” anyị nwekwara ike ịhazigharị oge anyị iji nwee ike inweta ndị bi n’ókèala anyị n’ụlọ ma si otú ahụ nwekwuo obi ụtọ n’ihe ùgwù nke ikpokọta “ụdị azụ̀ niile.” (Mat. 4:19; 13:47) Ànyị nwere ike ịga na nke ndị mmadụ n’oge mgbede ma ọ bụ gaa zie ha ozi ọma n’okporo ámá n’isi ụtụtụ? Ebumnobi Pọl bụ “ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma” ahụ, o jikwa ohere ọ bụla dapụtaranụ mee nke a.—Ọrụ 17:17; 20:20, 24.

3, 4. Olee otú anyị nwere ike isi na-agbanwe otú anyị si ezi ozi ọma, oleekwa ihe ndị ọ ga-arụpụta?

3 Na-agbanwe Otú I Si Ezi Ozi Ọma Mgbe Ọ Dị Mkpa: Ndị na-egbu azụ̀ na-agbanwe otú ha si egbu azụ̀ iji gbute otu ụdị azụ̀ ha chọrọ igbu. Olee otú anyị nwere ike isi zie ndị bi n’ókèala anyị ozi ọma Alaeze ahụ otú ga-amasị ha? Anyị kwesịrị iji akọ webata okwu ndị mmadụ na-achọkarị itinye ọnụ na ya ma gezie ntị nke ọma n’ihe ha nwere ikwu n’okwu ahụ. (Jems 1:19) Anyị nwere ike ịjụ ha ajụjụ ga-eme ka ha kwuo uche ha. (Ilu 20:5) Nke a ga-enyere anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi, ha agbanweekwa ndụ ha. Pọl ghọrọ “ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ.” (1 Kọr. 9:22) Ọ bụrụ na anyị ana-agbanwe otú anyị si ezi ozi ọma ka ọ na-adaba n’ihe ga-amasị onye ọ bụla anyị ga-ezi ozi ọma, ozi anyị ga na-eru ndị mmadụ n’obi.

4 Izi ndị mmadụ “ozi ọma nke ihe ka mma” na-enye anyị ezigbo ọṅụ! (Aịza. 52:7) Ka anyị na-eme “ihe niile n’ihi ozi ọma” iji nwee ike izi ya ọtụtụ mmadụ.—1 Kọr. 9:23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya