Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na February 23
IZU NA-AMALITE NA FEBRUARY 23
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 1 ¶1-9, okwu mmalite
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 32-35
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na March.
Nkeji 10: Kwadebe Inyefe Ụlọ Nche nke March 1 na Teta! nke January–March. Mgbe ị kọwatụchara isi ihe ndị dị na magazin ndị a, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịmasị ọtụtụ ndị bi n’ókèala unu, nakwa ihe mere ha ji chee otú ahụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ iji malite mkparịta ụka nakwa amaokwu Baịbụl ha ga-agụ tupu ha enyefee magazin ndị ahụ. Mezie ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Ị̀ Na-atụle Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị Kwa Ụbọchị? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-esi n’okwu mmalite dị n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2009. Kwuo uru ọ bara iwepụta oge kwa ụbọchị tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ya. Jụọ ndị na-ege ntị mgbe ha na-eji atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị na uru ndị ha riterela.
Abụ nke 160