Ikwusa Ozi Ọma Na-eme Ka Okwukwe Anyị Sikwuo Ike
1. Olee uru ikwusa ozi ọma na-abara anyị?
1 Ikwusachi ozi ọma anya na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, na-emekwa ka anyị nwekwuo obi ụtọ. N’eziokwu, ihe bụ́ isi mere anyị ji ekwusa ozi ọma bụ iji mee Jehova obi ụtọ. Ma, ọ bụrụ na anyị erube isi n’iwu ahụ e nyere anyị ka anyị “kwusaa okwu Chineke,” Jehova ga-agọzi anyị, anyị eritekwa uru n’ụzọ ndị ọzọ. (2 Tim. 4:2; Aịza. 48:17, 18) Ma, olee otú ikwusa ozi ọma ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike ma mee anyị obi ụtọ?
2. Olee otú ozi ọma si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?
2 Okwukwe Anyị Na-esikwu Ike, A Na-agọzikwa Anyị: Ikwusa ozi ọma na-eme ka anyị lekwasị anya ná ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-eweta kama ilekwasị anya ná nsogbu ndị dị ugbu a. (2 Kọr. 4:18) Ịkọwara ndị mmadụ ihe Baịbụl na-akụzi na-eme ka okwukwe anyị nwere ná nkwa ndị Jehova kwere sikwuo ike, ọ na-emekwa ka anyị jirikwuo eziokwu ndị dị na Baịbụl kpọrọ ihe. (Aịza. 65:13, 14) Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ịbịa marakwuo onye Jehova bụ, nke ga-emekwa ka ha ghara ‘ịbụ nke ụwa,’ ọ na-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ịghara ịbụ nke ụwa.—Jọn 17:14, 16; Rom 12:2.
3. Olee otú ozi ọma anyị si enyere anyị aka inwe àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst?
3 Ikwusa ozi ọma na-enyere anyị aka inwe àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ‘na-aghọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ,’ nke ahụ ga-enyere anyị aka ịdịkwu umeala n’obi. (1 Kọr. 9:19-23) Ka anyị na-agwa ndị ‘a gbara akpụkpọ, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha’ okwu, otú ahụ ka anyị ga na-amụtakwu inwe obi ebere na ọmịiko. (Mat. 9:36) Anyị na-amụta ịtachi obi mgbe anyị nọgidesiri ike n’ozi anyị n’agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị mmasị ma ọ bụkwanụ na ha na-emegide anyị. Anyị na-enwekwu ọṅụ mgbe anyị wepụtara onwe anyị ijere ndị ọzọ ozi.—Ọrụ 20:35.
4. Olee otú i si na-ele ozi gị anya?
4 Anyị bụ nnọọ ndị a gọziri agọzi na e nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma, bụ́ nke na-ewetara Onye naanị ya ruru eru ka anyị fee, otuto! Ozi ọma na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ na-eme ka onye ọ bụla wepụtara onwe ya “ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma” ahụ nweta ọtụtụ ngọzi.—Ọrụ 20:24.