Na-akụzi Ihe Otú Ọ Ga-adị Mfe Nghọta
1. Gịnị bụ otu ụzọ dị mkpa e si enyere mmadụ aka ịmụta ihe, ya edookwa ya anya?
1 Ịkụzi ihe otú ọ ga-adị mfe nghọta bụ otu ụzọ dị oké mkpa e si enyere mmadụ aka ịmụta ihe. Ịtụle otú Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs, si kụzie ihe nwere ike inyere anyị aka inwekwu “nkà izi ihe.”—2 Tim. 4:2; Jọn 13:13.
2. Olee otú e si akụzi ihe n’ụzọ dị mfe, oleekwa ihe isi otú ahụ akụzi ihe na-arụpụta?
2 Kwuo Okwu Otú Ọ Ga-adị Mfe Nghọta: N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, e nwere eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-enwebeghị mmadụ kwutụrụla ha, e kwukwara ha n’ụzọ dị mfe nghọta. (Mat., isi nke 5-7) Mgbe ìgwè mmadụ nọ na-egere ihe Jizọs na-ekwu, “otú o si ezi ihe juru [ha] anya.” Ihe Jizọs kwuru metụrụ ndị ọrụ nche e zigara ka ha jide ya n’ahụ́ nke na ha sịrị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” (Mat. 7:28, 29; Jọn 7:46) Ọ dịghị mkpa ka anyị jiri okwu ndị siri ike nghọta na-akụzi ihe, ma ọ bụ jiri ihe atụ ndị toro oké ogologo na-akụzi ihe mgbe anyị chọrọ ka ndị ọzọ ghọta nnọọ eziokwu ahụ. E nwere ike iji okwu ndị dị mfe nghọta mee ka eziokwu ahụ doo anya.
3. Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị kọjuwe ndị na-ege ha ntị isi, oleekwanụ otú e nwere ike isi zere nke a?
3 Mara Ókè Ha Ga-aghọtaru: Mgbe Jizọs na-akụzi ihe, ọ na-echebara ndị na-ege ya ntị echiche, ma mara ókè ha ga-aghọtaru ihe ndị ọ na-akụziri ha n’otu oge. (Jọn 16:12) Anyị kwesịrị ileru anya ala ma dị njikere ime mgbanwe ụfọdụ ma a bịa n’ókè onye anyị na-akụziri ihe ga-aghọtaru, karịchaa mgbe anyị na ndị ikwu anyị, ndị ka malitere inwe mmasị n’ozi anyị, ma ọ bụ ụmụntakịrị, na-amụ ihe. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkọju ha isi, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha na-eme ka hà na-ege anyị nnọọ ntị. Ndị nwere ezi obi ga-anọgide na-amụta ihe banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Jọn 17:3; 1 Kọr. 3:6.
4. Gịnị mere o ji dị mkpa ilekwasị anya n’isi ihe ndị dị n’ihe a na-amụ kama ịkọwawa ihe niile?
4 Lekwasị Anya n’Ihe Ndị Bụ́ Isi: Jizọs emeghị ka o sie ike ịghọta ihe ọ na-akụzi n’ihi na ọ bịaghị kọwasịwa ihe ọ bụla ọ kụziri. Oge ọ sịrị: ‘Ndị niile nọ n’ili ncheta ga-apụta,’ ọ bịaghị kọwawa ebe abụọ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-anọ. (Jọn 5:28, 29) Mgbe anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’isi ihe ndị dị n’ihe anyị na-amụ ma zere iwebata ihe ndị na-adịghị mkpa n’ihe anyị na-amụ.
5. Olee ngọzi anyị nwere ike inweta ma ọ bụrụ na anyị akụzie ihe otú ọ ga-adị mfe nghọta?
5 Obi dị anyị nnọọ ụtọ na Jehova ji ụzọ dị mfe nghọta kụziere anyị ihe niile ọ dị mkpa ka anyị mara. (Mat. 11:25) Ka anyị na-akụzi ihe otú ọ ga-adị mfe nghọta ma nwee ọṅụ mmadụ na-enweta ma ozi ya rụpụta ihe dị mma.