Ozi Anyị Bụ Ihe Anyị Ji Egosi na Anyị Hụrụ Chineke n’Anya
1. Olee ihe Jizọs mere iji gosi na ya hụrụ Chineke n’anya?
1 Ọ bụ ịhụnanya mere Jizọs ji kwusaa ozi ọma. O doro anya na Jizọs ji ụzọ dị iche iche o si kwusaa ozi ọma gosi na ya hụrụ Jehova n’anya. Jizọs sịrị: “Ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, ọbụna dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme.” (Jọn 14:31) Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị nwekwara ihe ùgwù iji ozi anyị egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu.—Mat. 22:37; Efe. 5:1, 2.
2. Olee otú ịhụ Jehova n’anya si gbasa ozi anyị?
2 “Ka E Doo Aha Gị Nsọ”: Mgbe ọ bụla anyị ji ịnụ ọkụ n’obi were ohere ọ bụla anyị nwere gwa ndị ọzọ banyere Jehova na Alaeze ya, anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị sikwa otú ahụ soro na-edo aha ya nsọ. (Ọma 83:18; Ezik. 36:23; Mat. 6:9) Dị ka Jizọs, ozi anyị na-ekwusa bụ ezigbo ụzọ anyị si achọ mgbe niile ka e doo aha Jehova nsọ nakwa ka e mee uche ya.—Mat. 26:39.
3. Olee otú ịhụ Jehova n’anya si enyere anyị aka imeri nsogbu?
3 Ịhụnanya Na-enyere Anyị Aka Imeri Nsogbu: Ịhụ Jehova n’anya na-enyere anyị aka idi ụdị nsogbu ọ bụla. (1 Kọr. 13:4, 7) Jizọs nwetara ọtụtụ nsogbu mgbe ọ na-eje ozi ya, bụ́ ndị gaara eme ka ọ kwụsị ozi ahụ ọ na-eje. Ma, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọsiekwa ike ime uche ya, mere ka o merie nsogbu ndị ahụ o nwetara. (Mak 3:21; 1 Pita 2:18-23) Anyịnwa na-enwetakwa ọtụtụ nsogbu. Ihe ga-enyekwara anyị aka imeri ha bụ ịhụ Chineke n’anya. Ọ bụrụ na anyị eṅomie Kraịst nke ọma, obi ga-esi anyị ike ime ike anyị niile n’ozi anyị n’agbanyeghị nsogbu. Ọ bụ eziokwu na mkpagbu ezinụlọ, ọrịa, ime agadi, ma ọ bụ ndị mmadụ ịjụ ozi anyị nwere ike inye anyị nsogbu, ma ọ gaghị eme ka anyị ghara ime ike anyị niile n’ozi anyị, n’ihi na anyị ji ya egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya.
4. Olee ihe ùgwù ịhụ Jehova n’anya na-eme ka anyị mee?
4 Ịhụnanya siri ezigbo ike, anyị nwekwara ihe ùgwù iji ozi anyị egosi na anyị ji obi anyị dum hụ Chineke n’anya. (1 Kọr. 13:13) Ka oge Jehova ga-edo aha ya nsọ n’ụwa niile ruo mgbe ebighị ebi na-abịa n’ike n’ike, ka ‘ịhụnanya anyị na-abawanye ụba.’—Fil. 1:9; Mat. 22:36-38.