Ị̀ Dị Njikere Ịgba Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi?
1 Ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi nwere ike ịrụpụta ihe dị mma. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị gbara àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi, àmà ha gbara rụpụtakwara ihe ndị dị mma. (Jọn 4:7-15) Olee ihe anyị nwere ike ime iji gosi na anyị dị njikere ịgba ụdị àmà a?
2 Uwe na Ejiji: Iji ejiji dị mma mgbe niile ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịgwa ndị mmadụ ihe anyị kweere. (1 Tim. 2:9, 10) Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka ejiji anyị adịchaghị mma, o nwere ike ime ka o siere anyị ike ịgbara mmadụ àmà. Ma ọ bụrụ na ejiji anyị dị mma, o nwere ike ime ka ndị ọzọ chọọ ịma ihe mere ejiji anyị ji dị mma. Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà jiri ejiji dị mma mgbe ha na-eme njem, ha nọkwa n’akụkụ otu nwoke onye Alakụba. Mgbe nwoke a hụrụ na ha jiri ejiji dị mma, ọ jụrụ ha ma hà bụ Ndị Kraịst. Ajụjụ a mere ka ha nwee mkparịta ụka na Baịbụl ruo awa atọ.
3 Otú E Si Amalite Mkparịta Ụka: Mgbe Jizọs bịakwutere nwaanyị Sameria n’olulu mmiri Jekọb, otú o si malite mkparịta ụka bụ ịgwa nwaanyị ahụ ka o nye ya mmiri ka ọ ṅụọ. Anyị nwekwara ike ịmalite mkparịta ụka ma anyị kwunyetụrụ mmadụ okwu ma ọ bụ jụọ ya obere ajụjụ. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ obi agaghị akacha anyị, ma anyị rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, o nwere ike mee ka anyị “nwee nkwuwa okwu” ịmalite mkparịta ụka.—1 Tesa. 2:2.
4 Chọọ Ụzọ Gbaara Mmadụ Àmà: Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtala ụzọ ha ga-esi na-agbara ndị mmadụ àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi. Chebara ihe ndị ị na-eme n’ụbọchị echiche, chetakwa ụdị ndị gị na ha na-ahụ kwa ụbọchị. Jiri akwụkwọ anyị ndị ị ma ga-amasị ha, ya na obere Baịbụl. Na-eleru anya ala, gosikwa ndị gị na ha na-ahụ na i nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụrụ na ị na-ebu ụzọ chee echiche n’ohere ndị i nwere ike inwe n’ụbọchị iji gbaara ndị mmadụ àmà, ị ga-aka dịrị njikere ịgba ezigbo àmà.—Fil. 1:12-14; 1 Pita 3:15.
5 E nwere ihe abụọ dị mma mere anyị ga-eji jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agbara ndị mmadụ àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi. Otu bụ n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya, nke ọzọ abụrụ n’ihi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Ebe ọ bụ na oge a ga-ekwusa ozi ọma a na-agwụ n’ike n’ike, ọ dị mkpa ijikere ejikere maka ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi. Ugbu a oge ka dị, anyị kwesịrị ijikere ejikere mgbe niile izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze ahụ.—Rom 10:13, 14; 2 Tim. 4:2.
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
1. Olee ihe atụ gosiri na ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi nwere ike ịba uru?
2. Olee otú ejiji anyị nwere ike isi nyere anyị aka ịgba àmà?
3. Olee otú i sirila malite mkparịta ụka dị ka Jizọs mere?
4. Olee otú anyị ga-esi adị njikere ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi?
5. Gịnị mere o ji dị mkpa ijikere ejikere maka ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi?