Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/09 p. 6-7
  • Anyị Bụ Ndịàmà Mgbe Niile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Bụ Ndịàmà Mgbe Niile
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwulite Ihe Ị Ga-eji Zie Mmadụ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Jizọs Ezie Nwaanyị Sameria Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Too Jehova Site n’Ịgba Àmà Mberede
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 11/09 p. 6-7

Anyị Bụ Ndịàmà Mgbe Niile

1. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jizọs si zie otu nwaanyị ozi ọma n’olulu mmiri?

1 Jizọs agaala ije ọtụtụ awa. Ike gwụrụ ya, akpịrị na-akpọkwa ya nkụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya gara ịzụta nri, ọ nọdụrụ ala na-ezu ike n’akụkụ otu olulu mmiri dị n’otu obodo dị na Sameria. Jizọs abịaghị Sameria izi ozi ọma; o si obodo ahụ na-agafe mgbe ọ na-aga Galili ịga zie ozi ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, o ji ohere ahụ zie otu nwaanyị bịara isere mmiri ozi ọma. (Jọn 4:5-14) Gịnị mere o ji zie nwaanyị ahụ ozi ọma? Ọ bụ n’ihi na o nwetụbeghị mgbe Jizọs kwụsịrị ịbụ ‘ezi onye àmà Jehova nke kwesịrị ntụkwasị obi.’ (Mkpu. 3:14) Anyị na-eṅomikwa Jizọs ma anyị bụrụ Ndịàmà Jehova mgbe niile.—1 Pita 2:21.

2. Olee otú anyị ga-esi jikere ịgba àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi?

2 Jikere Ejikere: Otu ụzọ anyị si egosi na anyị jikeere ejike ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi bụ ịhụ na anyị ji akwụkwọ anyị mgbe ọ bụla. Ọtụtụ ndị nkwusa na-eji traktị ha ga-enye ndị na-ere ahịa, ndị na-agbanyere ndị mmadụ mmanụ ụgbọala, na ndị ọzọ ha hụrụ n’ụbọchị. (Ekli. 11:6) Otu nwanna nwaanyị nke na-emekarị njem na-ahụ na ya tinyere obere Baịbụl na akwụkwọ Bible Na-akụzi na pọọsụ ya, ọ na-agbalịkwa ikwunyere onye nọ ya n’akụkụ okwu.

3. Olee otú anyị nwere ike isi malite nkwurịta okwu?

3 Kwulite Otu Ihe: Anyị gbawa àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi, ọ dịghị mkpa na anyị ga-eji ihe dị na Baịbụl malite. Mgbe Jizọs ziri nwaanyị ahụ ọ hụrụ n’olulu mmiri ozi ọma, o bughị ụzọ gwa ya na ya bụ Mesaya. Naanị ihe o mere bụ ịgwa ya ka o nye ya mmiri ka ya ṅụọ, nke mekwara ka nwaanyị ahụ jụọ ya ajụjụ. (Jọn 4:7-9) Otu nwanna nwaanyị chọpụtara na ime ụdị ihe a Jizọs mere na-enyere ya aka ịmalite mkparịta ụka. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ya ma ọ̀ na-agba Krismas ma ọ bụ Ista, kama ịsị na ihe mere ya anaghị agba ya bụ n’ihi na ya bụ Onyeàmà Jehova, ihe ọ na-ekwu bụ: “Ekpebiri m na agaghị m eso na-eme ya.” Onye ahụ jụrụ ya ajụjụ ahụ ga-achọzi ịma ihe mere na ọ naghị agba ya, nwanna nwaanyị ahụ na-ejizi ohere ahụ gbaara ya àmà.

4. Gịnị mere ihe e kwuru na Matiu 28:18-20 ji eme ka ị na-anụ ọkụ n’obi?

4 Ọ bụ eziokwu na Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi kwusachaa ozi ọma ọ bịara n’ụwa ikwusa, ọ ka nwekwara nnọọ mmasị n’ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ taa otú ahụ o si rụọ ya. (Mat. 28:18-20) N’ihi ya, dị ka Jizọs, bụ́ Onye anyị na-eso ihe nlereanya ya, anyị bụ Ndịàmà ndị dị njikere ikwupụta okwukwe anyị n’ihu ọha n’oge ọ bụla.—Hib. 10:23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya