Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
December 1
“O ruo n’oge a n’afọ, ndị mmadụ na-akọkarị akụkọ ihe ndị mere n’oge a mụrụ Jizọs. Ma, legodị otú Baịbụl si kọọ akụkọ ahụ. [Gụọ Matiu 2:1, 11.] Ị̀ chọpụtara ihe dị iche n’ihe Baịbụl kọrọ na otú ahụ ndị mmadụ si akọ ya? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kọrọ nke bụ́ eziokwu.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 31.
Jenụwarị–Mach
“O doro anya na nsogbu ga na-adapụta n’ezinụlọ ọ bụla. Ma, ebee ka i chere ezinụlọ nwere nsogbu ga-esi enweta ndụmọdụ ndị ga-enyere ha aka inwe obi ụtọ. [Chere ka ọ zaa. Gụzie Abụ Ọma 32:8.] Teta! a kwuru ọtụtụ ihe ọ ga-abụ ndị ezinụlọ mee, ya enyere ha aka inwe obi ụtọ.
Jenụwarị 1
“Okpukpe ndị e nwere taa anaghị ekwu otu ihe banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Olee otú i chere Chineke si ele onye na-aṅụ mmanya anya? [Chere ka ọ zaa.] Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na o nwere oge Jizọs mere ka mmiri ghọọ mmanya, Baịbụl kwukwara ihe a e dere ebe a. [Gụọ Ilu 23:20a.] Magazin a gosiri ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ mmanya.”
Jenụwarị–Mach
“Ì kwetara na ọtụtụ ezinụlọ nọ ná nsogbu taa? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ n’ime ha amaghị na Baịbụl nwere ndụmọdụ ndị nwere ike inyere ha aka. Ka m gụọrọ gị otu n’ime ha.” [Gụọrọ ya otu amaokwu Baịbụl dị na magazin ahụ.] Teta! a gosiri otú ihe ndị e kwuru na Baịbụl ga-esi nyere ezinụlọ dị iche iche aka imeri nsogbu ndị ha na-enwe.”