Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/11 p. 1
  • Nyere Onye Nwe Ụlọ Aka Ịtụgharị Uche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nyere Onye Nwe Ụlọ Aka Ịtụgharị Uche
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-agwa Ndị Na-achọghị Ịnụ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inye Ndị Mmadụ Akwụkwọ Bible Na-akụzi
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Ka Anyị Kpọọ Okwu Aha!
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 10/11 p. 1

Nyere Onye Nwe Ụlọ Aka Ịtụgharị Uche

1. Olee ihe kacha mma anyị kwesịrị ime ma anyị gaa ozi ọma?

1 Anyị gaa ozi ọma, ọ̀ dị mma ka anyị na ndị nwe ụlọ na-arụ ụka ka ọ̀ ka mma inyere ha aka ịtụgharị uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha ejirizie aka ha kpebie nke bụ́ eziokwu? Pọl onyeozi nyeere ndị Juu bi na Tesalonaịka aka ịtụgharị uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, “n’ihi ya, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe.” (Ọrụ 17:2-4) Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-ezi ozi ọma aka ịtụgharị uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru?

2. Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, olee otú anyị ga-esi eme ka Pọl?

2 Echefula Ihe Ndị A Kụziiri Ha na Ihe Ndị Ha Kweere: Ọ bụrụ na anyị chọrọ inyere ndị bi n’ókèala anyị aka ịtụgharị uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, anyị kwesịrị icheta ihe ndị a kụziiri ha na ihe ndị ha kweere. Mgbe Pọl bịara Ariopagọs ka o zie ndị Grik ozi ọma, o bu ụzọ kwuo ihe ndị ha mabu ama nakwa ihe ndị ha kweere. (Ọrụ 17:22-31) N’ihi ya, mgbe ị na-akwadebe ihe ị ga-agwa ndị mmadụ n’ozi ọma, cheta ihe ndị bi n’ókèala unu kweere na ihe ha na-anaghị ekweta na ọ bụ eziokwu. (1 Kọr. 9:19-22) Ọ bụrụ na onye ị na-agwa okwu ekwetaghị ihe ị na-ekwu, gbaa mbọ chọpụta ebe gị na ya nwere otu olu ma jiri ebe ahụ zie ya ozi ọma.

3. Olee uru ọ bara ịjụ onye anyị na-ezi ozi ọma ajụjụ?

3 Jụọ Onye Nwe Ụlọ Ajụjụ Ga-enyere Ya Aka Iche Echiche: O nweghị otú anyị ga-esi enyere onye ije aka ịmata otú ọ ga-esi eru ebe ọ na-aga ma ọ bụrụ na anyị amaghị ebe o ruterela. N’otu aka ahụ, o nweghị otú anyị ga-esi enyere onye anyị na-ezi ozi ọma aka ịmata nke bụ́ eziokwu ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ mata ihe o kweere. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, tupu ọ gwa mmadụ nke bụ́ eziokwu, ọ na-ebu ụzọ jụọ onye ahụ ajụjụ iji mata ihe o chere. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe otu nwoke jụrụ ya, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Tupu Jizọs azaa ya ajụjụ ahụ, o bu ụzọ jụpụta ya ihe o chere. (Luk 10:25-28) O nwekwara mgbe Pita zara ndị jụrụ ya ajụjụ ihe na-ezighị ezi, Jizọs jụrụ ya ajụjụ ndị nyeere ya aka ịma ihe ọ gaara aza ha. (Mat. 17:24-26) N’ihi ya, ọ bụrụ na onye anyị na-ezi ozi ọma ajụọ anyị ajụjụ ma ọ bụkwanụ kwuo ihe Baịbụl na-ekwughị, anyị nwere ike jụọ ya ajụjụ ga-enyere ya aka iche echiche.

4. Gịnị mere anyị ga-eji gbalịa nyere onye anyị na-ezi ozi ọma aka ịtụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru?

4 Ọ bụrụ na anyị enyere onye anyị na-ezi ozi ọma aka ịtụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru, anyị na-eme ụdị ihe ahụ Onye Ozizi Ukwu, bụ́ Jizọs, na ndị na-ezisa ozi ọma n’oge ochie mere. Ọ pụtakwara na anyị na-akwanyere onye ahụ ùgwù ma na-asọpụrụ ya. (1 Pita 3:15) Nke a nwere ike ime ka o kwe ka anyị bịa na nke ya n’ụbọchị ọzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya