Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 10
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 10
Abụ nke 44 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 11 ¶1-4, igbe ndị dị na p. 84, 86-87 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ilu 7-11 (Nkeji 10)
Nke 1: Ilu 8:1-21 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ị̀ Ga-amatali Ndị Amụma Ụgha?—td 29A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Baịbụl Ji Sị, “Abụla Onye Ezi Omume Gabiga Ókè”—Ekli. 7:16 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Kwuo ihe dị ebe ahụ e dere “Akụkọ Ozi,” bụ́ nke dị na peeji nke 8. Jaa ọgbakọ mma maka mbọ ha gbara n’ozi ọma n’ọnwa Eprel n’ihi na o so n’ihe mere ka anyị nwee akụkọ ozi ahụ mara mma.
Nkeji 15: Ị̀ Nwaala Ime Ya? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri nkeji ole na ole kọwaa ihe ndị e kwuru n’isiokwu ndị a gbara n’Ozi Alaeze Anyị n’oge na-adịbeghị anya: “Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma n’Ụbọchị Sọnde?” (km 5/11) na “Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-agba Àmà n’Okporo Ámá” (km 6/11). Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha si mee ihe ndị a tụrụ aro ha n’isiokwu ndị a nakwa uru ndị ha ritere.
Nkeji 15: “Nyere Onye Nwe Ụlọ Aka Ịtụgharị Uche.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 3, mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na onye nwe ụlọ nọ na-arụ ụka mgbe onye ahụ jụrụ ya otu n’ime ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ anyị n’ozi ọma ma ọ bụrụ na ha achọghị ige anyị ntị. Meekwa ihe ngosi ọzọ ebe onye nkwusa ahụ nọ na-ajụ onye nwe ụlọ ahụ ajụjụ ga-eme ka ọ tụgharịa uche n’ajụjụ ọ jụrụ ya n’ihe ngosi nke mbụ.
Abụ nke 102 na Ekpere