Chebe Uche Gị
1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ sekit afọ 2013? Oleekwa uru mgbakọ a ga-abara anyị?
1 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, na uche ha dum hụ Jehova n’anya. (Mat. 22:37, 38) Mgbakọ distrikti anyị gara n’afọ a, nke isiokwu ya bụ “Chebe Obi Gị!,” nyeere anyị aka ilerukwu ụdị mmadụ anyị bụ anya. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ 2013 ga-emere anyị. Isiokwu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ga-abụ “Chebe Akọnuche Gị,” nke mgbakọ sekit abụrụ “Chebe Uche Gị.” Mgbakọ sekit ga-ebido n’ọnwa Jenụwarị 2013. E si na Matiu 22:37 nweta isiokwu ya. Mgbakọ a ga-enyere anyị aka ilebarakwu anya n’ihe anyị na-eche n’echiche iji hụ na ha abụghị ihe ndị ga-akpasu Jehova iwe.
2. Olee ajụjụ ndị a ga-aza ná mgbakọ ahụ?
2 Okwu Ndị A Ga-ekwu: N’okwu ndị a ga-ekwu ná mgbakọ a, a ga-aza ajụjụ ndị e dere n’okpuru ebe a. Azịza ajụjụ ndị ahụ bụ isi ihe a chọrọ ka anyị mụta ná mgbakọ ahụ.
• Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iche ‘echiche mmadụ’?
• Olee otú anyị nwere ike isi kpupụ ndị na-ekweghị ekwe ihe e ji mee ka uche ha kpuo ìsì?
• Olee ụdị echiche anyị kwesịrị inwe?
• Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịna-atụgharị uche nke ọma?
• Olee otú anyị ga-esi kwe ka Jehova na-agwa anyị ihe anyị ga-eme?
• Olee otú di, nwunye, nne na nna, na ụmụ ha ga-esi mee ka udo dịrị n’ụlọ ha?
• Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ejikerela maka ụbọchị Jehova?
• Gịnị ka ike ájị̀ n’ume maka ọrụ pụtara?
• Olee uru ndị na-eme ihe ha mụtara ga-erite?
3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị gaa mgbakọ a ma n’ụbọchị Satọdee ma n’ụbọchị Sọnde? Gịnịkwa mere o ji dị mma ka anyị gee ntị nke ọma ma mee ihe ndị anyị mụtara?
3 Setan eforola ntutu taa na ya ga-eji ihe ọjọọ merụọ uche anyị. (2 Kọr. 11:3) Ọ bụ ya mere anyị ga-eji gbaa mbọ hụ na ihe anyị na-eche n’echiche bụ ihe ga-adị Jehova mma. Anyị kwesịrị ijisi ike na-eche echiche ka Jizọs ma ghara itinye aka n’omume ọjọọ ụwa na-eme. (1 Kọr. 2:16) N’ihi ya, gbalịa gaa gere okwu ndị a ga-ekwu ma n’ụbọchị Satọdee ma n’ụbọchị Sọnde. Hụkwa na i gere ntị nke ọma. Mgbakọ a ga-enyere gị aka ijikwu ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke kpọrọ ihe.—1 Pita 1:13.