Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/10 p. 4-5
  • Mgbakọ A Kwadebere Iji Nyere Ndị Ozi Chineke Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbakọ A Kwadebere Iji Nyere Ndị Ozi Chineke Aka
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Sekit nke Ga-enyere Anyị Aka Ịghara Imebi Mmekọrịta Anyị na Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Chebe Uche Gị
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 11/10 p. 4-5

Mgbakọ A Kwadebere Iji Nyere Ndị Ozi Chineke Aka

1. Olee ihe ọhụrụ e bidoro n’afọ 1938, gịnịkwa mere e ji bido ya?

1 N’afọ 1938, nzukọ Jehova bidoro otu ihe ọhụrụ. A gwara ọgbakọ dị iche iche ka ha bịa mgbakọ zoonu, bụ́ nke a na-akpọ mgbakọ sekit ugbu a. Gịnị mere e ji bido mgbakọ a? Akwụkwọ bụ́ Informant (nke a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị ugbu a) nke Jenụwarị 1939 kwuru, sị: “Mgbakọ ndị a so n’ihe Jehova ji nzukọ ya akwadebe ka o nwee ike nyere anyị aka n’ozi Alaeze ya. Ntụziaka ndị a na-enye na ha dị oké mkpa n’ihi na ha ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịrụ ọrụ ahụ e nyere anyị nke ọma.” Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa bụ́ nke dị naanị puku iri ise na puku asatọ n’afọ 1938 dịzi ihe karịrị nde ndị nkwusa asaa n’afọ 2009, o doro anya na mgbakọ sekit na-arụpụta ihe mere e ji bido ya, nke bụ́ ka o nyere ndị ozi Chineke aka “ịrụ ọrụ ahụ e nyere” ha!

2. Olee ihe ụfọdụ a ga-atụle ná mgbakọ sekit anyị nke afọ 2011?

2 Isiokwu nke Afọ Na-abịa Abịa: Anyị na-atụ anya mgbakọ sekit nke ga-amalite na Jenụwarị afọ 2011, na-atụkwa anya agbamume anyị ga-enweta na ya. Isiokwu ya bụ “Unu Abụghị nke Ụwa.” E si na Jọn 15:19 nweta ya. Olee okwu ụfọdụ a ga-ekwu bụ́ ndị ga-abara ndị ozi Chineke uru? N’ụbọchị Satọdee, anyị ga-ege okwu isiokwu ya bụ “Olee Otú Ozi Oge Niile Si Echebe Anyị?” Anyị ga-egekwa okwu mmadụ atọ ga-ekwu, nke isiokwu ha bụ “Ekwela Ka ‘Anụ Ọhịa ahụ’ Merụọ Gị,” “Ekwela Ka ‘Oké Nwaanyị Akwụna ahụ’ Merụọ Gị,” nakwa “Ekwela Ka ‘Ndị Ahịa nke Ụwa’ Merụọ Gị.” N’ụbọchị Sọnde, anyị ga-ege okwu mmadụ anọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Hụ Jehova n’Anya, Ahụla Ụwa n’Anya.” Okwu ndị ọzọ a ga-ekwu bụ “Bụrụnụ ‘Ndị Ala Ọzọ na Ndị Bi Nwa Oge’” na “Nwee Obi Ike! Ị Ga-emerili Ụwa.”

3. Olee uru ndị anyị nwere ike irite ma anyị gaa mgbakọ sekit?

3 Mgbe otu nwanna nwaanyị na-anaghị ejechizi ozi ọma anya gachara otu mgbakọ sekit na nso nso a, o kwuru na ihe ndị e kwuru ebe ahụ mere ka ya chebakwuoro onwe ya echiche nakwa ka ya kpebisie ike na ya ga “na-apụta ozi ọma kama ịna-achọ ihe ya ga-agbado ụkwụ wee na-agbara ịga ozi ọma ọsọ!” O doro anya na mgbakọ sekit nke afọ 2011 ga-enyere anyị niile aka ịhụ Jehova n’anya kama ịhụ ụwa n’anya. (1 Jọn 2:15-17) Hụ na ị gara mgbakọ a ma gee ntị nke ọma ka i nwee ike rite ezigbo uru n’ihe ndị a kwadebere iji nyere ndị ozi Chineke aka!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya