Jiri Otu Isiokwu Nye Mmadụ Magazin Abụọ
Isiokwu ndị na-agba ma n’Ụlọ Nche ma na Teta! na-amasịcha ndị mmadụ. Anyị chọọ inye mmadụ Ụlọ Nche na Teta!, anyị kwesịrị ikwu okwu naanị n’otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! ahụ. Anyị ekwesịghị ịkọrọ onye ahụ ihe niile dị na ha. Anyị kwesịkwara ịma ihe magazin nke ọ bụla kwuru. Tupu anyị enye ha mmadụ, anyị kwesịrị ileru anya ala mara isiokwu ga-amasị onye ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị gaa na nke mmadụ hụ ihe ụmụaka ji egwu egwu, anyị nwere ike iji isiokwu kwuru gbasara ezinụlọ gwa ya okwu. Ọ bụrụ na ọ bụ nna nwe ụlọ ka anyị hụrụ, anyị nwere ike iji isiokwu kwuru gbasara ihe ụfọdụ na-adị ụmụ nwoke mma nye ya magazin ahụ. N’agbanyeghị na ọ bụ naanị otu isiokwu ka anyị ga-ekwu gbasara ya, anyị kwesịrị inyekọta mmadụ Ụlọ Nche na Teta! ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-agụ ha.