Igbe Ajụjụ
◼ Olee otú onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ga-agaru ọmụmụ ihe na ozi ọma tupu ya eruo eruo ka e mee ya baptizim?
Ihe kacha mkpa mmadụ ga-ekpebi ná ndụ ya bụ ime baptizim. N’ihi ya, tupu ndị okenye ekwuo na mmadụ ruru eru ka e mee ya baptizim, ihe Chineke chọrọ ka ọ na-eme kwesịrị ido ya anya nke ọma. Otú o si ebi ndụ kwesịrị ịgosi na ọ na-eme ihe Chineke chọrọ.
Chineke chọrọ ka Ndị Kraịst na-agachi ọmụmụ ihe anya. N’ihi ya, onye a na-emebeghị baptizim kwesịrị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya. (Hib. 10:24, 25) O kwesịkwara ịbụ na ọ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. O nwekwara ike ịna-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
Jizọs nyere Ndị Kraịst ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, onye nkwusa a na-emebeghị baptizim kwesịrị ịna-agachi ozi ọma anya tupu e mee ya baptizim. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ọnwa ole ka o kwesịrị ikwusa ozi ọma tupu e mee ya baptizim? O kwesịrị ikwusatetụ ozi ọma aka iji gosi na o kpebiela iji ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma kwa ọnwa. (Ọma 78:37) Ma, o kwesịghị ikwusa ya ọtụtụ ọnwa tupu o ruo eru ka e mee ya baptizim. O nwere ike ịbụ ọnwa ole na ole. Awa ole ka o kwesịrị ịna-enye n’ọnwa? E nweghị awa ole a kapịrị ọnụ ọ ga na-enye. Ndị okenye kwesịrị icheta na otú ihe si dịrị Okeke abụghị otú o si dịrị Okoafọ.—Luk 21:1-4.
Mmadụ chọọ ime baptizim, ya na ndị okenye na-atụle ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ Ndị A Haziri. Ma ọ bụrụ n’ọgbakọ ndị okenye na-ehighị nne, ndị ohu na-eje ozi nwere ike iso ha tụlee ajụjụ ndị ahụ. Ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi kwesịrị icheta na mmadụ niile abụghị otu. N’ihi ya, ha kwesịrị ịkpachara anya mgbe ha na-ekpebi ma mmadụ ò ruru eru ka e mee ya baptizim. Ha kwesịrị ịhụ na onye ahụ chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova nakwa na ọ ghọtara na ịnọ n’ọgbakọ Jehova na ikwusa ozi ọma Alaeze ya bụ ihe ọma Chineke meere anyị. Ndị okenye ga-echeta na onye ahụ ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ nakwa na ọ gaghị na-ezi ozi ọma ka ndị nọtọrela aka n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na onye ahụ erubeghị ime baptizim, ha kwesịrị iwetu obi gwa ya ihe mere ha ji chee otú ahụ. Ha kwesịkwara inyere ya aka ka o nwee ike iru eru n’oge ọzọ.