Anyị Ga-amalite Ịmụ Akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso n’Izu Na-amalite na Jenụwarị 6
1. Malite n’izu Jenụwarị 6, gịnị ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso?
1 Jehova chọrọ ka anyị bịaruo ya nso. (Jems 4:8) Akwụkwọ ga-enyere anyị aka ịbịarukwu ya nso bụ Bịaruo Jehova Nso. Anyị ga-amalite ịmụ ya n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’izu na-amalite na Jenụwarị 6, 2014. Peeji nke atọ n’akwụkwọ ahụ kwuru ihe mere e ji bipụta ya. Ọ sịrị na anyị ga-abịarukwu Chineke nso ma anyị na-echebara otú o si akpa àgwà echiche, na-echeta otú Jizọs Kraịst si mee ka Jehova mgbe ọ bịara n’ụwa, na-achọkwa otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova na Jizọs. Anyị mụrụ akwụkwọ a n’ọnwa Mach afọ 2004 ruo n’ọnwa Mee 2005. Kemgbe ahụ, ihe dị ka nde ndị nkwusa abụọ abatala n’ọgbakọ. N’ihi ya, nke a ga-abụ nke mbụ ndị nkwusa ndị a ga-eso ọgbakọ jiri akwụkwọ a mụọ gbasara àgwà Jehova. Ma, ndị nkwusa ndị mụrụ akwụkwọ a n’oge gara aga, ịmụ ya ọzọ ga-enyere ha aka ịmatakwu àgwà Jehova.—Ọma 119:14.
2. Olee otú anyị ga-esi amụ akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso?
2 Otú A Ga-esi Amụ Ya: Nwanna ga-eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ ga-ekwu okwu mmeghe ga-adị nkenke. Ihe ọ ga-ekwu agaghị akarị otu ahịrịokwu ma ọ bụ ahịrịokwu abụọ. N’akwụkwọ ahụ, e deghị amaokwu Baịbụl ndị a ga-agụ. N’ihi ya, nwanna ahụ ga-ahọrọ amaokwu Baịbụl ndị a ga-agụ, ha enyere ụmụnna aka ịghọta ihe a na-amụ. A mụchaa ihe, o nwere ike ịjụ otu ajụjụ ma ọ bụ ajụjụ abụọ iji tụleghachi ihe a mụrụ. Ọ bụrụ na e nwere igbe bụ́ “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche” n’ebe a na-amụ n’ụbọchị ahụ, ọ ga-eji ajụjụ ndị dị n’igbe ahụ mere ajụjụ ntụleghachi. Ọ bụrụ na oge dị, e nwere ike ịgụ amaokwu Baịbụl ụfọdụ ndị dị n’igbe ahụ. A gụchaa ha, ya ajụọ ajụjụ ndị ga-enye aka ịkọwa ha.
3. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-eme mgbe anyị ga na-amụ akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso? Oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ịna-eme otú ahụ?
3 Gbalịa Rite Uru na Ya: Ọ bụrụgodị na i so mụọ akwụkwọ a n’oge gara aga, gbalịa ka ị mụọ ebe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu ị gawa. A mụwa ya, gbaa mbọ ka ị zaa ajụjụ. Ime otú ahụ ga-ewetara Jehova otuto, nyere gị aka icheta ihe a mụrụ, nyekwa aka mee ka okwukwe ndị bịara ọmụmụ ihe sikwuo ike. (Ọma 35:18; Hib. 10:24, 25) Ị ga-abịarukwu Jehova nso ma ọ bụrụ na a mụchaa ihe, gị ana-atụgharị uche otú ị ga-esi na-akpa àgwà ka ya. (Ọma 77:11-13) Ị na-eme otú a, ọ ga-adịrị gị mfe irubere Jehova isi, ịkọrọ ndị ọzọ onye ọ bụ agaghịkwa ara gị ahụ́.—Ọma 150:1-6.