Otú Anyị Ga-esi Enyere Ndị Na-ekweghị na Baịbụl Bụ Okwu Chineke Aka
1. Ọ̀ bụ mmadụ niile ka ọ ga-adị mma ka anyị jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ọmụmụ ihe? Kọwaa.
1 Onye chọrọ ife Chineke kwesịrị ibu ụzọ mara ihe Baịbụl kwuru. Ma, ụfọdụ ndị na-abụghị ndị chọọchị ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke. E nwekwara ndị ọzọ na-ekweghị na Chineke dị, ha ekweghịkwa na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Olee ihe anyị nwere ike iji nyere ụdị ndị a aka bụ́ ndị o nwekwara ike ịbụ na ha agaghị enwe mmasị ịmụ akwụkwọ Bible Na-akụzi? Ka anyị tụlee otú anyị ga-esi nyere ụdị ndị a aka. Ebe anyị si nweta aro ndị a bụ n’ihe ụmụnna ndị si ihe dị ka mba iri abụọ kwuru.
2. Ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị na ya ekweghị na Chineke dị, gịnị ka anyị ga-agba mbọ chọpụta? Gịnịkwa mere anyị ga-eji mee otú ahụ?
2 Ndị Na-ekweghị na Chineke Dị: Ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị na ya ekweghị na Chineke dị, ọ ga-adị mma ka anyị gbalịa chọpụta ihe kpatara ya. Ihe kpatara ya ọ̀ bụ na o kwere na mmadụ si n’enwe pụta? Ọ̀ bụ mmegbu dị n’ụwa a kpatara ya, ka ọ̀ bụ ekwu ọzọ eme ọzọ dị na chọọchị? Ka ò si n’obodo ndị ọchịchị mere ka ndị mmadụ ghara ikwere na Chineke dị? O nwekwara ike ịbụ na o kwere na Chineke dị, ma o cheghị na ya kwesịrị ịtụkwasị ya obi. Ọtụtụ ndị nkwusa na-eme ha gaa ozi ọma hụ ụdị onye a, ha ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ kemgbe ụwa gị ka ị na-ekweghị na Chineke dị?” Ọ bụrụ na ị jụọ mmadụ ụdị ajụjụ a, onye ahụ nwere ike ikwu ihe mere na o kweghị na Chineke dị. O kwuwe ya, gee ya ntị nke ọma, anapụla ya okwu n’ọnụ. Ị manụ na ọ bụ mgbe anyị matara ihe mere na mmadụ ekweghị na Chineke dị, ka anyị ga-ama ihe anyị ga-agwa ya, marakwa akwụkwọ anyị ga-enye ya.—Ilu 18:13.
3. Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù n’agbanyeghị ihe ha kweere?
3 Onye ahụ kwuchaa, gbalịa ka ihe ị ga-agwa ya ghara iyi ya ka ị na-akatọ ihe o kweere. Otu nwanna onye Amerịka kwuru otú anyị ga-esi edowe ọnụ gwa ụdị onye ahụ okwu. Ọ sịrị: “Anyị ga-echeta na anyị ekwesịghị ịmanye mmadụ ka o kwere ihe ọ na-achọghị ikwere. Mkpa anyị abụghị imeri onye ahụ. Kama, anyị nwere ike ịjụ ya ajụjụ ga-eme ka o chebara ihe o kweere echiche ma jiri aka ya ghọta nke bụ́ eziokwu.” Ihe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eji ebidokarị okwu ya ma ya hụ ụdị ndị a bụ “Ì chetụla ụdị ihe a?”
4. Olee otú anyị ga-esi enyere ndị na-ekpe okpukpe Buda aka ka ha mara na Chineke dị?
4 Ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe Buda ekweghị na Chineke dị. Ụfọdụ ndị nkwusa nọ na Briten na-eji broshọ bụ́ Peace and Happiness—How to Find Them ezi ụdị ndị a ozi ọma. Ha na ha buru ụzọ tụlechaa okwu mmalite dị na broshọ ahụ, ha atụlee ebe na-ekwu na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ha mụchaa ebe ahụ, ha amụọkwa isiokwu na-ekwu banyere Baịbụl. Ka oge na-aga, ha na-egosi onye ahụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gwa ya na ọ bụrụgodị na o kweghị na Chineke dị na o nwere ike ịmụ Baịbụl n’ihi na ihe dị na ya na-abara mmadụ niile uru. Otu ọsụ ụzọ onye Amerịka nọ n’ọgbakọ e ji asụsụ Chaịniiz amụ ihe kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ. Anyị nye ha akwụkwọ ọ bụla, ha na-agụcha ya tupu anyị abịa na nke ha ọzọ. Ha amagahị ihe anyị na mmadụ ịmụ Baịbụl pụtara. N’ihi ya, m na-enyekarị ha broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ụbọchị mbụ m gara ozi ọma na nke ha n’ihi na e dere ya otú ọ ga-adị mfe ka e jiri ya na-amụrụ mmadụ Baịbụl.” N’Amerịka, otu onye nlekọta sekit na-elekọta ọgbakọ ndị ji asụsụ Chaịniiz amụ ihe kwuru na e nwere ike inye onye na-ekweghị na Chineke dị akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe mbụ anyị gara ozi ọma na nke ya. Ma, ọ ga-aka mma ka anyị na onye ahụ malite ịmụ isi nke abụọ, bụ́ ebe ga-enyere ya aka ịmata gbasara Baịbụl. Ebe ọ bụ na onye ahụ ekweghị na Chineke dị, anyị na ya ekwesịghị ịmụwa isi nke mbụ, bụ́ nke na-ekwu gbasara Chineke.
5. Gịnị mere anyị ji kwesị inwere ndị na-ekweghị na Chineke dị ndidi mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma?
5 Anyị agaghị atụ anya na anyị gakwuru onye na-ekweghị na Chineke dị zichaa ya ozi ọma, ya ekwere ozugbo na ọ dị. Anyị kwesịrị inwere ụdị ndị a ndidi. Anyị nwere ike ịgakwuru onye ahụ ugboro ugboro. Ka oge na-aga, o nwere ike ikweta na o nwere ike ịbụ na Chineke dị ma ọ bụkwanụ ya abịa mata ihe mere mmadụ nwere ike iji kwere na Chineke dị.
6. Gịnị mere ndị ụfọdụ anaghị enwe mmasị ka a mụwara ha Baịbụl?
6 Ndị Na-ekweghị na Baịbụl Bụ Okwu Chineke: Mmadụ nwere ike ikwere na Chineke dị ma o kweghị na Baịbụl bụ Okwu ya. O nwere ike ịbụ na onye ahụ bụ onye obodo ebe ndị mmadụ na-ekweghị na Kraịst ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-ele Baịbụl anya ka akwụkwọ ndị chọọchị. O nwekwara ike ịbụ na onye ahụ bụ onye obodo ebe ndị mmadụ kwere na Kraịst ma ha ejighị ife Chineke kpọrọ ihe, o cheghịkwa na e nwere uru Baịbụl bara. Olee ihe anyị nwere ike ime ka ụdị onye a chọọ ịmụ Baịbụl ma kweta ka anyị na ya jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi mụwa ihe?
7. Olee otú anyị ga-esi mee ka ndị mmadụ nwee mmasị ịnụ ihe Baịbụl kwuru?
7 Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Gris detaara anyị akwụkwọ ozi n’oge gara aga. Ihe ha kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi nyere onye na-ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke aka bụ ịsape ya gụọ ya ka ọ nụ. Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtala na ihe Baịbụl kwuru na-aka eru mmadụ n’obi karịa ihe onye nkwusa chepụtara n’onwe ya. (Hib. 4:12) Ọtụtụ ndị na-achọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-ekwu ma ha hụ aha Chineke na Baịbụl.” Alaka ụlọ ọrụ nke dị n’India dekwara, sị: “Ndị Hindu na-ege ụmụnna ntị n’ozi ọma ma a gwa ha ihe ha ga-eme ka ha keta ndụ ebighị ebi ma ọ bụkwanụ a gwa ha na onye nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. Ha na-egekwa ntị ma anyị gwa ha na Chineke kwere anyị nkwa na e nweghị onye ga-aka ibe ya n’ụwa ọhụrụ nakwa na mmadụ niile ga-adị n’otu.” Ihe a na-egosi na ndị mmadụ ga-achọ ịnụ ozi ọma anyị ma anyị buru ụzọ kwutetụ nsogbu ndị ha na-enwe tupu anyị ekwuwezie otú Alaeze Chineke ga-esi eme ka nsogbu ahụ ghara ịdị.
8. Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa ndị na-ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’ihi otú ndị chọọchị si akpa àgwà?
8 Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’ihi otú ndị chọọchị si akpa àgwà, ọ ga-adị mma ka anyị gwa ya na ndị chọọchị anaghị eme ihe Baịbụl kwuru. Ihe ọzọ alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’India dere n’akwụkwọ ozi ha bụ: “Mgbe ụfọdụ, anyị kwesịrị ime ka ndị mmadụ mara na Baịbụl abụghị akwụkwọ ndị chọọchị.” Ha kwuru na isi nke anọ nke broshọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? na-amasịkarị ndị Hindu. Isiokwu ahụ kwuru otú ndị chọọchị sirila na-akụziri ndị mmadụ ihe na-adịghị na Baịbụl ma na-akpa àgwà ọ katọrọ. Na Brazil, ihe otu ọsụ ụzọ na-agwakarị ndị mmadụ bụ: “Ọ́ gaghị adị mma ma ị matakwuo ihe Baịbụl kwuru? Ọtụtụ ndị na-ahapụ ihe chọọchị ha na-akụziri ha, jiri obi ha niile na-achọ ka ha mara nke bụ́ eziokwu. Gịnwa nwekwara ike ịmata nke bụ́ eziokwu.”
9. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na okwu agwụla mgbe mmadụ gwara anyị na ya ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke?
9 Jehova na-enyocha obi mmadụ niile. (1 Sam. 16:7; Ilu 21:2) Ya hụ onye nwere ezi obi, ya emee ka ọ bịa fewe ya. (Jọn 6:44) O nweghị onye kụziiri ọtụtụ n’ime ndị ahụ gbasara Chineke, ha amaghịkwa ihe ọ bụla banyere Baịbụl. Ọ bụ mgbe ha nụrụ ozi ọma ka ha bịara nweta ezi ihe ọmụma ma ghọọ ndị e nwere ike ịzọpụta. (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ agwa gị na ya ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke, echela na okwu agwụla. I nwere ike iji akwụkwọ ọzọ ma ọ bụkwanụ ihe ga-eme ka o nwee mmasị na Baịbụl nyere ya aka. Mgbe ị hụrụ na ọ malitela inwe mmasị na Baịbụl, unu nwere ike ịmụwa akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
[Igbe dị na peeji nke 4]
Ọ bụrụ na onye ị bịara na nke ya ekwuo na ya ekweghị na Chineke dị, i nwere ike ịsị ya:
• “Ọ̀ bụ kemgbe ụwa gị ka ị na-ekweghị na Chineke dị?” Ajụjụ a ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe mere o ji chee otú a.
• Ọ bụrụ na ọ na-ekpe okpukpe Buda, jiri ihe dị na peeji nke 9-12 na broshọ bụ́ Lasting Peace and Happiness—How to Find Them zie ya ozi ọma.
• Ọ bụrụ na o kwere na mmadụ si n’enwe pụta, ihe ndị a nwere ike inyere ya aka:
“È Kere Ya Eke?” nke na-agba na Teta!
Vidio bụ́ The Wonders of Creation Reveal God’s Glory
Broshọ ndị a dị naanị n’asụsụ Bekee A Satisfying Life—How to Attain It, isi nke anọ ya; Was Life Created?; na The Origin of Life—Five Questions Worth Asking
• Ọ bụrụ na onye ahụ ekweghị na Chineke dị n’ihi mmegbu dị n’ụwa a ma ọ bụkwanụ ahụhụ ndị mmadụ na-ata, akwụkwọ ndị a nwere ike inyere ya aka:
Is There a Creator Who Cares About You?, isi nke iri
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, isi nke isii na Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, isi nke isii
• Gị na onye ahụ nwere ike ịmalite ịmụ akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe ọ bụla o bidoro ikweta na Chineke dị. Ọ ga-adị mma ma unu malite ịmụ isi nke abụọ ma ọ bụkwanụ isiokwu ọzọ ga-enyere ya aka ikweta na Chineke dị.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ihe i nwere ike ime ma onye ị bịara na nke ya ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke
• Gị na ya tụlee isi nke 17 na nke 18 n’akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?
• Ọ bụrụ onye Hindu, gị na ya tụlee broshọ bụ́ Why Should We Worship God in Love and Truth?
• Ọ bụrụ onye na-ekpe okpukpe ndị Juu, gị na ya tụlee broshọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War?, peeji nke 3-11.
• I nwere ike ịgwa onye na-ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke uru ime ihe Baịbụl kwuru na-abara mmadụ. Ihe ndị unu nwere ike ịtụle bụ:
“Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka” nke na-agba na Teta!
Vidio bụ́ The Bible—Its Power in Your Life
Broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!, isi nke 9 na nke 11; Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, peeji nke 22-26; na A Satisfying Life—How to Attain It, isi nke 2
Ọ bụrụ onye na-ekpe okpukpe Buda, gị na ya tụlee broshọ bụ́ The Pathway to Peace and Happiness, peeji nke 3-7.
Ọ bụrụ onye Alakụba, gị na ya tụlee broshọ bụ́ Real Faith—Your Key to a Happy Life, isi nke 3.
Ọ bụrụ na ndị ị na-ezi ozi ọma bụ ndị na-ekweghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke, ọ ga-aka mma ka ị ghara ịgwa ha na ihe ị na-agwa ha si na Baịbụl ruo mgbe ị gara nletaghachi na nke ha ọtụtụ ugboro.
• Ọ bụrụ na ị chọrọ ka mmadụ mara na Baịbụl anaghị ebu amụma ụgha, ihe ndị gị na onye ahụ ga-atụle bụ:
Vidio bụ́ The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy
Broshọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, peeji nke 27-29
• Gị na onye ahụ nwere ike ịmụwa akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe ọ bụla ọ malitere ịjụ ajụjụ ndị gbasara ihe Baịbụl na-akụzi.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ọ bụrụ na onye ị bịara na nke ya asị: “Ekweghị m na Chineke dị,” i nwere ike ịsị:
• “Ka m gwanụ gị ihe mere m ji kwere na Chineke dị.” I nwere ike iji ihe ndị e kwuru na peeji nke 84-86 n’akwụkwọ Reasoning zie ya ozi ọma ma ọ bụ gị agwa ya na ị ga-ewetara ya otu akwụkwọ anyị ị gụrụ n’oge na-adịbeghị anya.
• I nwere ike ịgwa onye ahụ, sị: “Ka anyị were ya na Chineke dị, olee ụdị onye ị ga-achọ ka ọ bụrụ?” Ọtụtụ ndị ga-aza na ha ga-achọ ka ọ bụrụ onye hụrụ ndị mmadụ n’anya, onye na-ekpe ikpe ziri ezi, onye na-eme ebere nakwa onye na-anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Mmadụ gwa gị ụdị ihe a, jiri Baịbụl gosi ya na ihe a niile o kwuru bụ àgwà Chineke. (Gị na ya nwekwara ike ịtụle akwụkwọ Bible Na-akụzi, isi nke mbụ, malite na paragraf nke isii.)
Ọ bụrụ na onye ị chọrọ izi ozi ọma asị: “Ekweghị m na Baịbụl bụ Okwu Chineke,” i nwere ike ịsị:
• “Ọtụtụ ndị na-ekwu otú ahụ. Ndị ụfọdụ na-ekwu na sayensị na Baịbụl anaghị ekwu otu ihe. O nwekwara ndị na-ekwu na Baịbụl abaghị uru. Ka m jụgodị gị, ị̀ gụtụla Baịbụl? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gị na ya tụlee peeji nke atọ na broshọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile.] Otú ndị chọọchị si ezi ihe na-adịghị na Baịbụl emeela ka ọtụtụ ndị jụ Baịbụl. M bịa ụbọchị ọzọ, anyị ga-atụle peeji nke anọ na nke ise ka ị hụ ozizi ụgha ha na-ezi.”
• “Ọ bụghị naanị gị na-ekwu ụdị ihe a. Ka m gosi gị ihe m gụtara na Baịbụl tọrọ m ụtọ. [Gụọ Job 26:7 ma ọ bụ Aịzaya 40:22, ebe ahụ na-egosi na sayensị na-akwado ihe Baịbụl kwuru.] Baịbụl na-ekwukwa ọtụtụ ihe na-enyere ezinụlọ ọ bụla aka ibi n’udo. M bịa ụbọchị ọzọ, m ga-egosi gị otú Baịbụl si enyere ezinụlọ aka.”
• “I meela maka ihe i kwuru. Ma, ka m jụọdị gị, ọ bụrụ na Baịbụl bụ Okwu Chineke, gịnị ka i chere ọ ga na-ekwu?” Ọ bụrụ na ọ zachaa, gị na ya gụọ amaokwu ọ bụla dị na Baịbụl nke kwadoro ihe ahụ o kwuru.