Kpọkọta Ndị Mmadụ
1. Olee otú mgbakọ ukwu na mgbakọ mba niile si yie mgbakọ ahụ ụmụ Izrel nwere mgbe ha ka si n’Ijipt pụta?
1 Obere oge ụmụ Izrel si n’Ijipt pụta, Jehova gwara Mozis ka ọ ‘kpọkọtara ya ndị’ Izrel n’Ugwu Saịnaị ka ha wee mụta ịtụ egwu ya, kụziekwara ụmụ ha iwu ya. (Diut. 4:10-13) Ụmụ Izrel echefughị mgbakọ ahụ echefu, o mekwara ka okwukwe ha sie ike. N’oge na-adịghị anya, ndị ohu Jehova ga-amalite ịga mgbakọ ukwu na mgbakọ mba niile ka Jehova kụziere ha ihe. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị rite uru ná mgbakọ ndị a?
2. Olee otú anyị ga-esi jikere maka mgbakọ?
2 ‘Jikere’: Jehova gwara ndị Izrel ka ha jikere maka mgbakọ ahụ pụrụ iche ha ga-enwe n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụ. 19:10, 11) Ndị niile ga-aga mgbakọ ndị ahụ kwesịkwara ijikere, ma hà nwere ihe omume ma ọ bụ na ha enweghị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ ga-agwa ndị ha na-arụrụ ọrụ ka ha nye ha oge ka ha nwee ike ịga mgbakọ. O nwere ike ịdị gị otú ọ dị Nehemaya n’oge ochie. Ọ bụ ya bụ obu ihe ọṅụṅụ Eze Atazaksis. Ọ chọrọ ịhapụ ọrụ ya ka o soro ibe ya rụgharịa mgbidi Jeruselem, ma ọ ma na Eze nwere ike ịjụ ka ọ gaa. N’ihi ya, o kpere ekpere, jirizie obi ike gaa rịọ eze ka ọ hapụ ya ka ya gaa Jeruselem. Eze hapụrụ ya, nyekwa ihe ndị ha ga-eji rụgharịa mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:1-9) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ime atụmatụ otú ị ga-esi gaa mgbakọ nakwa ebe ị ga-ebi. Ọ bụrụ na e nwere ndị nwere mkpa pụrụ iche, ndị okenye ga-enwe mmasị inyere ha aka ịga mgbakọ. Gbaa mbọ ka ị na-eru n’oge n’ụbọchị nke ọ bụla, geekwa ntị nke ọma.—Hib. 2:1.
3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwado obi anyị maka ihe omume ndị a ga-eme ná mgbakọ?
3 Ihe ọzọ dị mkpa anyị ga-eme bụ ịkwado obi anyị ka anyị nwee ike ige ntị ma mụta ihe a ga-ekwu. (Ezra 7:10) Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig, ị ga-ahụ usoro ihe omume mgbakọ a. E dekwara isiokwu ndị a ga-atụle na amaokwu Baịbụl isiokwu nke ọ bụla si na ya. Ọ ga-adị mma ka anyị jiri oge anyị ji enwe Ofufe Ezinụlọ tụlee isiokwu ndị ahụ na amaokwu Baịbụl ndị ahụ n’ime izu ole na ole tupu anyị agaa mgbakọ. Ụfọdụ ụmụnna na-ebipụta usoro ihe omume a, jiri ya na-ede isi ihe ha mụtara ma ha gaa mgbakọ.
4. Olee otú ndị nne na nna ga-esi jiri mgbakọ a kụziere ụmụ ha ihe?
4 ‘Kụziere Ya Ụmụ Gị’: Otu n’ime ihe mere e ji gwa ụmụ Izrel ka ha gbakọta n’Ugwu Saịnaị bụ ka ha kụziere ụmụ ha iwu Jehova. (Diut. 4:10) Mgbakọ a ga-enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha iwu Jehova. Ha na ụmụ ha kwesịrị ịnọ n’otu ebe mgbe a na-eme ihe omume ka ha wee nyere ha aka ige ntị. A gbasaa n’ụbọchị nke ọ bụla, nne na nna na ụmụ ha nwere ike ikwurịta banyere ihe omume ụbọchị ahụ, ha nwekwara ike ikwurịta ha ọzọ mgbe ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ.
5. Olee uru anyị ga-erite ma anyị gaa mgbakọ a na-abịa abịa?
5 Mgbakọ ahụ pụrụ iche ụmụ Izrel nwere n’Ugwu Saịnaị mere ka obi dịkwuo ha ụtọ na ha bụ ndị ohu Chineke. (Diut. 4:7, 8) Mgbakọ a anyị ga-aga n’oge na-adịghị anya ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ otú ahụ ụmụ Izrel nwere n’oge ahụ. N’ime ụbọchị atọ a anyị ga-anọ ná mgbakọ, anyị ga-ahapụ ụwa Setan na nsogbu ya niile ma nọrọ ụmụnna anyị nso, na-egere Okwu Chineke. (Aịza. 35:7-9) Ka ụbọchị Jehova na-eru nso, anyị ekwesịghị ịhapụ nzukọ anyị, kama, anyị na ụmụnna anyị ga na-ezukọ, na-agbarịta ibe anyị ume.—Hib. 10:24, 25.