Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/14 p. 2
  • Na-abịa n’Oge

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-abịa n’Oge
  • Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-abịa Ihe n’Oge?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ịbịa Ihe n’Oge
    Teta!—2016
  • Gị Na Ime Ihe n’Oge
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Na-ebinụ Obi n’Ụzọ Kwesịrị Ozi Ọma Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2014
km 5/14 p. 2

Na-abịa n’Oge

1. Olee ihe Jehova na-eme nke anyị kwesịrị iṅomi?

1 Jehova na-eme ihe ọ bụla n’oge ya. Dị ka ihe atụ, ọ na-enyere ndị ohu ya aka “n’oge kwesịrị ekwesị.” (Hib. 4:16) Ọ na-enyekwa anyị nri ime mmụọ “n’oge kwesịrị ekwesị.” (Mat. 24:45) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ụbọchị iwe ya ‘agaghị anọ ọdụ’ tupu ya abịa. (Hab. 2:3) O nweghị onye ga-asị na otú a Jehova si eme ihe ọ bụla mgbe oge ya ruru abaraghị ya uru. (Ọma 70:5) Ma, ọ naghị adịchara anyị mfe ime ihe n’oge ma ọ bụ ịbịa ihe n’oge n’ihi na anyị ezughị okè, ọrụ jukwara anyị aka. Gịnị mere anyị ga-eji gbaa mbọ ka anyị na-abịa ihe n’oge?

2. Anyị na-eme ihe n’oge, olee otú ọ ga-esi eme ka e too Jehova?

2 N’oge ikpeazụ a, ọtụtụ ndị anaghị ejide onwe ha, ha hụkwara naanị onwe ha n’anya. Ọ bụ ya mere ha ji abịa ihe mgbe masịrị ha kama ịbịa n’oge. (2 Tim. 3:1-3) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na-aga ọrụ n’oge, na-eme ihe n’oge ya, na-agakwa ọmụmụ ihe n’oge, ndị ọzọ ga na-ahụ anyị, ha ga-etokwa Jehova. (1 Pita 2:12) Ànyị achọpụtala na anyị na-agba mbọ na-aga ọrụ anyị n’oge ma na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma n’azụ oge? Ọ bụrụ na anyị na-aga ọmụmụ ihe n’oge, ya bụ, na anyị na-anọ ya mgbe a malitere ịbụ abụ nakwa mgbe a na-ekpe ekpere mmeghe, ọ na-egosi na anyị na-eme ka Nna anyị nke eluigwe. Ị manụ na Jehova na-eme ihe n’usoro.—1 Kọr. 14:33, 40.

3. Olee otú ịbịa ihe n’oge si egosi na anyị na-achọ ọdịmma ndị ọzọ?

3 Ọ bụrụ na anyị na-abịa ihe n’oge, ọ ga-egosi na anyị na-achọ ọdịmma ndị ọzọ. (Fil. 2:3, 4) Dị ka ihe atụ, anyị agaghị eme ka uche ụmụnna anyị pụọ n’ihe a na-ekwu ma ọ bụrụ na anyị na-abịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ nzukọ ozi ubi n’oge. Ma, ọ bụrụ na ihe e ji mara anyị bụ ịbịa ihe n’azụ oge, ndị ọzọ ga-ewere ya na onwe anyị na-ebu anyị isi, nakwa na anyị na-eche na ihe anyị ji oge anyị eme dị anyị mkpa karịa ihe ndị ọzọ ji nke ha eme. Onye na-abịa ihe n’oge na-akpọ ihe mkpa, ndị mmadụ na-atụkwasịkwa ya obi. Ị manụ na ọ bụ ụdị enyi ahụ ka ndị mmadụ na-achọ.

4. Olee ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na-abịakarị ihe n’azụ oge?

4 Ọ bụrụ na ị na-abịakarị ihe n’azụ oge, chọpụta ihe kpatara ya. Hazie ihe ndị ị na-eme nke ọma ka i nwee ike ịna-eme ihe i kwesịrị ime n’oge ya. (Ekli. 3:1; Fil. 1:10) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. (1 Jọn 5:14) Ịbịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ nzukọ ozi ubi n’oge bụ otu n’ime ụzọ anyị si egosi na anyị ejighị iwu abụọ kacha mkpa Chineke nyere anyị egwu egwu. Iwu abụọ ahụ bụ ịhụ Chineke n’anya na ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya.—Mat. 22:37-39.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya