Ọnwa Ọgọst Ga-apụ Iche
Anyị Ga-enye Ndị Mmadụ Traktị Ọhụrụ
1. Ebe ọ bụ na o ruwela otu narị afọ e chiri Jizọs eze, olee ihe pụrụ iche anyị ga-eme n’ụwa niile?
1 Ọ fọrọ obere ka o ruo otu narị afọ e chiri Jizọs eze n’eluigwe. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka anyị jiri akwụkwọ anyị ga-enye ndị mmadụ too aha Jehova. E nwere traktị ọhụrụ anyị ga-enye ndị mmadụ n’ụwa niile n’ọnwa Ọgọst. Isiokwu traktị ahụ bụ Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra? Traktị a ga-agwa ndị mmadụ na ọ bụ na Baịbụl ka ha ga-achọta azịza ajụjụ ọ bụla ha nwere. Ọ ga-akọwakwa otú ihe ndị dị na jw.org ga-esi enyere ha aka.
2. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị soro ná ndị ga-eji oké olu too Jehova n’ọnwa Ọgọst?
2 Ọtụtụ Ndị Ga-eto Jehova: Ebe ọ bụ na ọnwa Ọgọst ga-apụ iche, onye nkwusa ọ bụla mere baptizim nke chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ nwere ike inye awa iri atọ ma ọ chọọ. Ihe mere e ji mee ya otú a bụ ka ọtụtụ ndị nwee ike iso too Jehova. Ụmụ akwụkwọ na ndị na-arụ ọrụ malite na Mọnde ruo Fraịdee ga-enwe ike ịsụ ụzọ inyeaka n’ihi na ọnwa Ọgọst nwere ụbọchị Fraịdee ise, Satọdee ise nakwa Sọnde ise. Ọ bụrụ na e nwere onye ị na-amụrụ ihe rurula ịbụ onye nkwusa ma ọ bụ na nwa gị chọrọ ịbụ onye nkwusa, gwa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ka ha soro anyị kwusaa ozi ọma n’ọnwa a ga-apụ iche. Ọ bụ eziokwu na n’ebe ụfọdụ, ndị ọsụ ụzọ oge niile na-aga ezumike n’ọnwa Ọgọst ma ha rụzuo awa ole ha kwesịrị ịrụta n’afọ, ma, ọ ga-adị mma ma ha hazie oge ha nke ọma ka ha nwee ike iso jee ozi n’ọnwa ahụ. Ugbu a ka anyị na ndị ezinụlọ anyị kwesịrị ikwu otú anyị ga-esi soro ná ndị ga-eji “oké olu tie mkpu wee too Jehova” n’ọnwa Ọgọst.—Ezra 3:11; Ilu 15:22.
3. Olee ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọnwa Ọgọst a?
3 Nke a abụghị nke mbụ anyị na-eme ụdị ihe a, ma anyị na-atụ anya na anyị agaghị echefu nke ọnwa Ọgọst a echefu. Ka anyị maranụ ma n’ọnwa Ọgọst a, ànyị ga-eji awa kacha elu gaa ozi ọma. Ànyị nwerenụ ike inweta ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nakwa nke ndị ọsụ ụzọ anyị na-enwetụbeghị? Ka afọ ije ozi 2014 na-agwụ, anyị na-arịọ ka Jehova gọzie mbọ niile ndị ohu ya ga-agba n’ụwa niile iji kwusaa ozi ọma Alaeze ya n’ọnwa Ọgọst.—Mat. 24:14.