ISIOKWU ỌNWA A: “KWUSAA OKWU CHINEKE, JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA YA.”—2 TIM. 4:2.
Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ọnọdụ Ọ Bụla Ị Nọ
1. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’aka Devid?
1 Eze Devid anaghị ada mbà mgbe ọ bụla ihe ọ tụrụ anya ya na-emeghị. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe ọ chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ. Ma, Jehova gwara ya na ọ bụghị ya ga-arụ ya. Devid adaghị mbà, kama, ọ kwadebere ihe nwa ya Sọlọmọn ga-eji arụrụ Jehova ụlọ nsọ ahụ. (1 Eze 8:17-19; 1 Ihe 29:3-9) Kama ichegbuwe onwe ya banyere ihe ọ na-agaghị emeli, o chewere banyere ihe ọ ga-emeli. Ka anyị na-agba mbọ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, olee otú anyị ga-esi ṅomie Devid?
2. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ichebara echiche?
2 Mee Ihe I Nwere Ike Ime: Ọtụtụ ndị ahazigharịala ọrụ ha ka ha nwee ike ịna-asụ ụzọ inyeaka ma ọ bụkwanụ bụrụ ọsụ ụzọ oge niile. (Mat. 6:22) Ì nwere ike ime ka ha? Ọ bụrụ na i chebara ọrụ gị na ọnọdụ gị echiche, i nwere ike ịhụ na e megheerela gị “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.” Ọ bụrụ na ụdị ụzọ ahụ emegheere gị, gbaa mbọ jiri ya kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke.—1 Kọr. 16:8, 9.
3. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịna-eme ma ọ bụrụ na anyị agaghị asụli ụzọ?
3 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọnọdụ gị agaghị ekwe gị sụọ ụzọ? Elegharala ọnọdụ ndị ọzọ ị ga-eji zie ozi ọma anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-ahụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova n’ebe ị na-arụ ọrụ, i nwere ike iji ohere ọ bụla zie ha ozi ọma. Ọ bụrụkwanụ na ahụ́ adịchaghị gị, i nwekwara ike izi ndị dọkịta ma ọ bụ ndị nọọsụ na-arụ n’ụlọ ọgwụ ị nọ ozi ọma. Cheta na ndị agadi ma ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị nwere ike inye nkeji iri na ise n’ọnwa. Mgbe ọ bụla i ziri mmadụ ozi ọma ma ọ bụ nye mmadụ akwụkwọ ma ọ bụ traktị ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ịkpọ òkù mgbe ị na-anọghị n’ozi, gbaa mbọ dee ha n’akwụkwọ. I dewe awa gị ná ngwụcha ọnwa ahụ, gbakọnye ha n’akụkọ ozi gị. Ị ga-ahụ na nkeji ole na ole ndị ahụ nwere ihe ha bụ.
4. Gịnị ka i kpebiri ịna-eme?
4 N’agbanyeghị ọrụ anyị na-arụ ma ọ bụ ọnọdụ anyị nọ, ka anyị niile na-eji ohere anyị nwere na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga na-enwe obi ụtọ, obi eruokwa anyị ala n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike iji na-akwado Alaeze Chineke.—Mak 14:8; Luk 21:2-4.