Akwụkwọ Ọhụrụ E Ji Eme Nchọnchọ
N’ụwa niile, nde kwuru nde ndị nkwusa na-eji Watch Tower Publications Index eme nchọnchọ. Ma, ọ dị naanị n’asụsụ ole na ole n’ihi na ihe ndị e depụtara na ya e ji eme nchọnchọ dị ọtụtụ. Ọ bụ ya mere e ji bipụta akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Ọ dị n’otu narị asụsụ na iri asaa. Akwụkwọ ndị e depụtara na ya bụ ndị nke e bipụtara malite n’afọ 2000 gbagowe. E bipụtaghị ya n’asụsụ ndị nwere Index, kama e tinyere ya na Watchtower Library nakwa n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị nke Dị n’Ịntanet n’asụsụ ndị ahụ. Akwụkwọ a e ji eme nchọnchọ ga-enyere gị aka ịchọta azịza ajụjụ ndị si na Baịbụl, ịghọtakwu ihe ndị na-edochaghị gị anya, ịkwado ọmụmụ ihe na ịmụ ihe nke ọma. Ọ ga-enyekwara gị aka n’ofufe ezinụlọ.